ỌNU-ỌGUGU 1 - Bible Lgbo

1Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, n'ulo-ikwū nzute, n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-abua, n'arọ nke-abua nke ọpupu ha puru n'Ijipt, si,

2Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha nile, nwoke ọ bula, onye na isi-ya onye na isi-ya;

3site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha n'Israel, unu gāgukọta ha, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, gi onwe-gi na Eron.

4Madu ganọye-kwa-ra unu, otù nwoke gādiri otù ebo; nwoke ọ bula, onye-isi ulo nna-ya-hà ka ọ bu.

5Ndia bu kwa aha ndikom unu na ha gēguzo: nke Reuben; Elizua nwa Shedeua.

6Nke Simeon; Shelumiel nwa Zurishadai.

7Nke Juda, Nahshon nwa Aminadab.

8Nke Isaka; Netanel nwa Zua.

9Nke Zebulun; Eliab nwa Hilon.

10Nke umu Josef: nke Efraim; Elishama nwa Amihud: nke Manase; Gameliel nwa Pedahzua.

11Nke Benjamin; Abidan nwa Gideoni.

12Nke Dan; Ahieza nwa Amishadai.

13Nke Asha; Pagiel nwa Ọkran.

14Nke Gad; Eliasaf nwa Deuel.

15Nke Naftali; Ahira nwa Inan.

16Ndia bu ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi-isi ebo nile nke ndi bu nna-ha; ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel ka ha bu.

17Moses na Eron we chiri ndikom ndia nke akpọrọ n'aha n'aha:

18ọ bu kwa nzukọ Israel nile ka ha kpọkọtara n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-abua, ha we kọ akukọ osuso-ọmumu-ha dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye na isi-ya onye na isi-ya.

19Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka ọ gukọtara ha n'ọzara Sainai.

20Ma umu Reuben, bú ọkpara Israel, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, nwoke ọ bula site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

21ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Reuben, ha di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-isi na ọgu ise.

22Nke umu Simeon, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ndi-ha agukọtara agukọta, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, nwoke ọ bula site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

23ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Simeon, ha di orú nnù uzọ asa na nnù asatọ na ọgu ise.

24Nke umu Gad, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

25ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Gad, ha di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-anọ na ọgu abua na iri.

26Nke umu Juda, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'onu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara oru arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

27ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Juda, ha di orú nnù uzọ iteghete na nnù isi na ọgu iri.

28Nke umu Isaka, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

29ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Isaka, ha di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-isi.

30Nke umu Zebulun, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

31ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Zebulun, ha di orú nnù uzọ asa na nnù atọ na ọgu iri.

32Nke umu Josef, bú nke umu Efraim, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

33ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Efraim, ha di orú nnù uzọ ise na nnu na ọgu ise.

34Nke umu Manase, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

35ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Manase, ha di orú nnù uzọ anọ na ọgu iri.

36Nke umu Benjamin, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

37ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Benjamin, ha di orú nnù uzọ anọ na nnù asatọ na ọgu iri.

38Nke umu Dan, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ogugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

39ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Dan, ha di orú nnù uzọ asa na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-ise.

40Nke umu Asha, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

41ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Asha, ha di orú nnù uzọ ise na nnù atọ na ọgu iri-na-ise.

42Nke umu Naftali, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnuọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

43ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Naftali, ha di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-atọ na ọgu iri.

44Ndia bu ndi agukọtara agukọta, ndi Moses na Eron gukọtara, ha na ndi-isi Israel, bú ndikom iri na abua: otù nwoke otù nwoke diri ulo nna-ya-hà ka ha bu.

45Ndi nile nke umu Israel agukọtara agukọta we di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha n'Israel;

46ọbuná ndi nile agukọtara agukọta we di orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri.

47Ma ndi Livai, dika ebo nke ndi bu nna-ha si di, agukọtaghi ha n'etiti ha.

48N'ihi na Jehova gwara Moses okwu, si,

49Nání, agukọtala ebo Livai, aguta-kwa-la ọnu-ọgugu-ha n'etiti umu Israel:

50ma gi onwe-gi me ndi Livai ka ha buru ndi nēlekọta ebe-obibi ihe-àmà, ndi nēlekọta kwa lhe-ya nile, ndi nēlekọta kwa ihe nile diri ya: ha onwe-ha ganēbu ebe-obibi ahu, na ihe-ya nile: ha onwe-ha gēje-kwa-ra ya ozi, ọ bu kwa buruburu ebe-obibi ahu ka ha gāma ulo-ikwū-ha.

51Ma na nbuli-ije nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēweda ya: ọzọ, n'ọmuma nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēguzo ya ọtọ: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.

52Umu Israel gāma kwa ulo-ikwū-ha, nwoke ọ bula n'akuku ọmuma-ulo-ikwū-ya, na nwoke ọ bula n'akuku ọkọlọtọ-ya, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di.

53Ma ndi Livai gāma ulo-ikwū-ha buruburu ebe-obibi ihe-àmà ahu, ka iwe we ghara idi n'aru nzukọ umu Israel: ndi Livai gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe-obibi ihe-àmà ahu.

54Umu Israel we me otú a; dika ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka ha mere.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help