ABÙ ỌMA 59 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Al-tashheth. Abù Ọma nke Devid: Michtam: mb͕e Sọl ziri ozi, ha we che ulo ime ka ọ nwua.

1Naputam n'aka ndi-irom, Chinekem:

Me ka m'si n'aka ndi nēbili imegidem nọ n'ebe di elu.

2Naputam n'aka ndi nālu ajọ ihe,

Zọputakwam n'aka ndi-ọbara.

3N'ihi na, le, ha echewo nkpuru-obim anwu;

Ndi di ike nēzukọ imegidem:

Ọ bughi n'ihi njehiem, ọ bughi kwa n'ihi nmehiem, Jehova.

4Mb͕e ọ nādighi ajọ omume m'mere ha nāb͕a ọsọ, dozie onwe-ha:

Kpọte Onwe-gi izutem, hu kwa.

5Gi onwe-gi kwa, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel,

Teta ileta mba nile:

Emelera ndi nāghọ aghughọ n'ajọ ihe amara. Selah

6Ha nālaghachi n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita,

Nāga obodo buruburu.

7Le, ha ji ọnu-ha nāsuputa okwu;

Mma-agha di n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha:

N'ihi na ònye nānu? bu ihe ha kwuru.

8Ma Gi onwe-gi, Jehova, gāchì ha ọchì;

I gākwa mba nile emò.

9Ikem, Gi ka m'gēlezi anya:

N'ihi na Chineke bu ulo-elum.

10Chineke nke eberem gābia izutem:

Chineke gēme ka m'lekwasi ndi nēchem anwu anya.

11Eb͕ula ha, ka ndim ghara ichezọ:

Were usu-ndi-agha-Gi me ka ha nāṅaghari, me kwa ka ha rida,

Onye-nwe-ayi, bú ọta-ayi.

12Nmehie nke ọnu-ha ka okwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha bu;

Ka anwude kwa ha nime npako-ha,

Na n'ihi ọb͕ub͕a-iyi na n'ihi okwu-ugha nke ha nākọ akukọ-ha.

13Me ka ha gwusia n'ọnuma-Gi, me ka ha gwusia, ka ha ghara idi ọzọ:

Ka ha mara kwa na Chineke nāchi achi nime Jekob,

Rue nsọtu nile nke uwa. Selah

14Ha nālaghachi kwa n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita,

Nāga obodo buruburu.

15Ndi ahu nāṅaghari iri ihe,

Ọ buru na afọ ejughi ha ha gānọ kwa ọnọdu-abali.

16Ma mu onwem gābù abù bayere ike-Gi;

E, m'gēti nkpu ọṅù bayere ebere-Gi n'ututu:

N'ihi na I buruworom ulo-elu,

Na ebe-nb͕alaga n'ubọchi nkpab͕u dirim.

17Ikem, Gi ka m'gābùku abù ọma:

N'ihi na Chineke bu ulo-elum, bú Chineke nke eberem.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help