ABÙ ỌMA 34 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke Devid; mb͕e ọ b͕anwere omume-ya n'iru Abimelek, o we chupu ya, o we la.

1M'gāgọzi Jehova na mb͕e nile:

Mb͕e nile ka otuto-Ya gādi n'ọnum.

2Jehova ka nkpuru-obim gēji nya isi:

Ndi di ume-ala n'obi gānu ya, we ṅuria ọṅu.

3Sonum me ka Jehova di uku,

Ka ayi buli kwa aha-Ya elu n'otù.

4Achọrọm Jehova, Ọ za-kwa-ram,

We naputam n'ujọm nile.

5Ha legidere Ya anya, we nwue enwu:

Ka ihere ghara ime kwa ha n'iru.

6Onye a ewedara n'ala kpọrọ òkù, Jehova we nuru ya,

We si na nkpab͕u-ya nile zọputa ya.

7Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya,

Ọ we dọputa ha.

8Detunu ire, hu na Jehova di nma:

Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya.

9Tuanu egwu Jehova, unu ndi nsọ Ya:

N'ihi na ọ dighi ihe nākọ ndi nātu egwu Ya.

10Nkpà akpawo umu-ọdum, agu aguwo kwa ha:

Ma ndi nāchọ Jehova, ọ dighi ezi ihe ọ bula gākọ ha.

11Bianu, umum, gem nti:

Egwu Jehova ka m'gēzi unu.

12Ònye bu nwoke ahu nke ndu nātọ ya utọ,

Nke nāhu ubọchi nile nke ndu n'anya, ka o we hu ọdi-nma?

13Chezi ire-gi ka ọ ghara ikwu ihe ọjọ,

chezi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi ka ha ghara ikwu okwu aghughọ.

14Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;

Nāchọsi udo ike, b͕aso kwa ya.

15Anya abua nke Jehova di n'aru ndi ezi omume,

Nti-Ya abua ghe-kwa-ra oghe na nkpu ha nētiku Ya.

16Iru Jehova nēmegide ndi nēme ihe ọjọ,

Ibipu ncheta-ha n'uwa.

17Ndi ezi omume tiri nkpu, Jehova we nuru,

We si na nkpab͕u-ha nile naputa ha.

18Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa,

Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha.

19Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume:

Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya.

20Ọ nēdebe ọkpukpu-ya nile:

Ọ dighi otù nime ha nyajiri anyaji.

21Ihe ọjọ gēme ka onye nēmebi iwu nwua:

Ọzọ, ndi nākpọ onye ezi omume asì, agāma ha ikpe.

22Jehova nāb͕aputa nkpuru-obi ndi-orù-Ya:

Agaghi-ama kwa ha ikpe, bú ndi nile nāb͕abà nime Ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help