ABÙ ỌMA 53 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Mahalath. Maschil Devid.

1Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di.

Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka ajọ omume-ha buru ihe-árú;

Ọ dighi onye nēme ezi ihe.

2Chineke siri n'elu-igwe lekwasi umu madu anya,

Ihu ma ọ di onye nwere uche,

Nke nāchọ Chineke.

3Ha nile n'otù n'otù alaghachiwo azu; ha ab͕aruwo n'otù dika miri;

Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye.

4Ndi nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe?

Bú ndi riworo nri site n'iri ndim,

Ma ha akpọkughi Chineke.

5N'ebe ahu ka ha turu oké egwu, n'ebe oké egwu nādigh:

N'ihi na Chineke esesawo ọkpukpu nke onye nāma ulo-ikwū-ya imegide gi;

I mewo ka ihere me ha, n'ihi na Chineke ajuwo ha.

6Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nzọputa Israel esi na Zaion puta!

Mb͕e Chineke gēji me ka ndọta-n'agha ndi-Ya lata,

Ka Jekob tegharia egwú ọṅù, ka Israel ṅuria ọǹu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help