JOB 17 - Bible Lgbo

1Emebiwo mọm, emewo ka ubọchim gwusia,

Ílì dirim.

2N'ezie ikwa-emò diyerem,

Anyam nānọ kwa ọnọdu-abali n'ikpasu-obi-ilu nile ha.

3Biko, do ihe-ibe, burum onye-mbe n'ebe Gi onwe-gi nọ;

Ònye ka ọ bu, bú onye gānaram n'aka?

4N'ihi na I zopuwo obi-ha n'inwe ezi uche:

N'ihi ya I gaghi-ebuli ha elu.

5Onye nēgosi ndi-eyì-ya inara òkè,

Ọbuná anya umu-ya gādala n'isi.

6Ọzọ, O guzowom dika ilu nke ndi nile di iche iche;

Onye ha nābusa ọnu-miri n'iru-ya ka m'ghọwo-kwa-ra.

7Anyam we nāhu inyoghi-inyoghi site na nkpasu-iwe,

Ihe dim n'aru di ka onyinyo, ha nile.

8Ibobo bayere nka gānwu ndi ziri ezi n'aru,

Onye nēmeghi ihe ọjọ gākpọte kwa onwe-ya imegide onye emeruru emeru.

9Ma onye ezi omume gējisi ike n'iso uzọ-ya,

Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n'iru n'iru n'inwe ume.

10Ma otú ọ di, biko, unu nile chigharia, bia:

Ma m'gaghi-achọta onye mara ihe n'etiti unu.

11Ubọchim nile agabigawo, emebiwo nzubem nile,

Bú ihe-nnweta nke obim.

12Ha nēdo abali n'ọnọdu ehihie:

Ha nāsi, Ìhè di nso iru ọchichiri.

13Ọ buru na elem anya ala-mọ na ọ gābu ụlọm;

Ọ buru na ab͕asawom utem n'ọchichiri;

14Ọ buru na akpọwom olùlù òkù, si, Nnam ka i bu;

Kpọ kwa ikpuru òkù, si, Nnem na nwa-nnem nwayi ka i bu;

15Òle ebe kwa ka olile-anyam di ub͕u a?

Olile-anyam kwa, ònye gēkiri ya?

16Rue ihe di n'ala-mọ ka ha gārida,

Ọ buru na izu-ike adirim otù mbe ahu n'ájá.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help