ABÙ ỌMA 9 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Muth-labben. Abù Ọma Devid.

1M'gēji obim nile kele Jehova;

M'gākọ kwa akukọ oké ọlu-Gi nile.

2M'gāṅuri ọṅu, obim gātọkwam utọ, nime Gi:

M'gābùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu;

3Mb͕e ndi-irom laghachiri azu,

Su ngọngọ, si kwa n'iru Gi la n'iyì.

4N'ihi na I kpewo ikpem ziri ezi na okwu-ikpem;

I nọduru n'oche-eze, buru onye-ikpe nēme ezi omume.

5I basiwo mba nile ọzọ nba, I mewo ka ndi nēmebi iwu la n'iyì,

I hichapuwo aha-ha rue mb͕e nile ebighi-ebi.

6Ndi-iro agwusiwo, ha bu nkpọnkpọ ebe rue mb͕e ebighi-ebi;

Ọzọ, obodo nile nke I ropuworo,

Ncheta-ha, ọbuná nke obodo ahu, alawo n'yì.

7Ma Jehova nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi:

O doziwo oche-eze-Ya ikpe ikpe.

8Ya onwe-ya gēkpe uwa dum madu bi ikpe n'ezi omume,

Ọ gēkpe ndi nile di n'uwa ikpe n'izi-ezi.

9Jehova bu-kwa-ra onye anāzọpia ulo-elu,

Bú ulo-elu nke diri mb͕e nile nke nkpà;

10Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi;

N'ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova.

11Bùkuenu Jehova abù ọma, bú Onye bi na Zaion:

Gosinu omume-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.

12N'ihi na Onye nājuta ọbara ndi eb͕uru eb͕u echetawo ha:

O chezọghi iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala.

13Merem amara, Jehova;

Hu nweda-n'alam nke sitere n'aka ndi nākpọm asì,

Gi Onye nēbulim elu site n'ọnu-uzọ-ama ọnwu;

14Ka m'we kọ akukọ otuto-Gi nile:

N'ọnu-uzọ-ama nile nke ada Zaion,

Ka m'ṅuria ọṅu na nzọputa-Gi.

15Mba nile ọzọ emikpuwo n'olùlù ha mere:

N'ub͕u nke ha zobere ka anānwude ukwu-ha.

16Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo:

N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah

17Ndi nēmebi iwu gālaghachi n'ala mọ,

Bú mba nile ndi nēchezo Chineke.

18N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka agēchezọ ob͕eye,

Olile-anya nke ndi di ume-ala n'obi agaghi-ala n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi.

19Bilie, Jehova; ekwela ka madu di ike:

Ka ekpe mba nile ikpe n'iru Gi.

20Jehova, doro ha ihe-egwu:

Ka mba nile mara na nání madu ka ha bu. Selah

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help