ABÙ ỌMA 114 - Bible Lgbo

1Mb͕e Israel siri n'Ijipt puta,

Mb͕e ulo Jekob siri na ndi nātatọ okwu puta;

2Juda ghọro ebe nsọ Ya,

Israel ghọrọ ala Ọ nāchi.

3Oké osimiri huru ya, we b͕alaga;

Jọdan chighariri la azu.

4Ugwu nile wuliri elu dika ebulu,

Ugwu ntà nile wuliri elu dika umu-aturu.

5Gini nēme gi, oké osimiri, na i nāb͕a ọsọ?

Gini nēme gi, Jọdan, na i nēchighari la azu?

6Gini nēme unu, ugwu, na unu nāwuli elu dika ebulu?

Gini nēme unu, ugwu ntà, na unu nāwuli elu dika umu-aturu?

7Ka o b͕ue gi nb͕u, gi uwa, site n'iru Onye-nwe-ayi,

Site n'iru Chineke nke Jekob;

8Onye b͕anwere oké nkume ka ọ ghọ ọdọ-miri juputara na miri,

B͕anwe ọmú ka ọ ghọ isi-iyi miri.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help