ABÙ ỌMA 79 - Bible Lgbo

Abù Ọma Esaf.

1Chineke, mba di iche iche abatawo n'ihe-nketa-Gi;

Ha emeruwo ulo uku Gi di nsọ;

Ha emewo Jerusalem ka ọ ghọ ihe etikpọro etikpọ.

2Ha ewerewo ozu ndi-orù-Gi nye iburu anu-ufe nke elu-igwe ihe-oriri,

Were kwa anu-aru nke ndi-ebere-Gi nye anu-ọhia nile nke uwa.

3Ha awusiwo ọbara-ha dika miri buruburu Jerusalem;

Ọ dighi kwa onye ọ bula ṅēli ozu-ha.

4Ayi aghọworo ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta,

Ghọ-kwa-ra ndi di ayi buruburu ihe-ichì-ọchì na ihe-ikwa-emò.

5Rùe ole mb͕e, Jehova, ka I ganēwe iwe rue mb͕e ebighi-ebi?

Ekworo-Gi, ọ̀ ganēre dika ọku?

6Wukwasi mba nile ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi,

Wukwasi kwa ala-eze nile nke nākpọkughi aha-Gi.

7N'ihi na ha eripiawo Jekob,

Me kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.

8Echetala ajọ omume nile nke ndi-mbu-ayi imegide ayi:

Kwe ka obi-ebere-Gi nile me ngwa izute ayi:

N'ihi na ayi enweghi ike ma-ọli.

9Yere ayi aka, Chineke nke nzọputa-ayi, n'ihi nsọpuru aha-Gi:

Naputa kwa ayi, kpuchi kwa nmehie-ayi, n'ihi aha-Gi.

10N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Òle ebe Chineke-ha nọ?

Ka amara ya n'etiti mba nile n'anya-ayi,

Bú ibọ̀-ọ́bọ̀ ọbara nke ndi-orù-Gi nke awusiworo.

11Kwe ka isu-ude nke onye-nkpọro bata n'iru Gi;

Dika idi-uku nke ogwe-aka-Gi si di me ka ndi nāghaghi inwu anwu fọdu;

12Gi nyeghachi kwa ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta-ha nime obi-ha okpukpu asa,

Bú nke ha jiri ta Gi uta, Onye-nwe-ayi.

13Ayi onwe-ayi, bú ndi-Gi na ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-gi,

Gēkele Gi rue mb͕e ebighi-ebi;

Ọb͕ọ nile ka ayi gākọrọ akukọ otuto-Gi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help