ABÙ NKE ABÙ 2 - Bible Lgbo

1Mu onwem bu rose nke Sheron,

Abum urodi nke ndagwurugwu.

2Dika urodi n'etiti ogwu,

Otú a ka eyìm di n'etiti umu-ndinyom.

3Dika osisi apple n'etiti osisi oké ọhia,

Otú a ka onye ihe-ya nātọm utọ di n'etiti umu-ndikom.

Ǹdò-ya ka m'chọsiworo ike, m'we nọdu ala,

Nkpuru-ya tọ-kwa-ra okpo-ọnum utọ.

4O mere ka m'bata n'ulo manya-vine,

Ọkọlọtọ-ya n'elum bu kwa ihu-n'anya.

5Werenu mbadamba nkpuru-vine amiri ami b͕am ume, werenu nkpuru-osisi apple me ka arum di ike:

N'ihi na onye nāria ọria ihu-n'anya ka m'bu.

6Aka-ekpe-ya di n'okpuru isim,

Aka-nri-ya nāb͕akum.

7Unu umu-ndinyom Jerusalem,

Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi,

Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n'anya teta, ma ọli,

Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.

8Ọ bu olu onye ihe-ya nātọm utọ! le kwa, ọ nābia,

Nāmali elu n'elu ugwu nile, nāwuli elu n'elu ugwu ntà nile.

9Onye ihe-ya nātọm utọ yiri mb͕ada ma-ọbu nwa-ele:

Le kwa, ọ nēguzo n'azu mb͕idi-ayi,

Ọ nēsi na window nile lebata anya,

Anya-ya nēsi n'oghere-inara-ifufe nwubata.

10Onye ihe-ya nātọm utọ zara, sim,

Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.

11N'ihi na, le, mb͕e oyi agabigawo,

Oké miri-ozuzo agawo, ọ lawo;

12Ahuwo okoko-ọhia anya n'ala;

Mb͕e abù ọma nke umu-nnunu eruwo,

Anuwo kwa olu nduru n'ala-ayi;

13Osisi fig achawo nkpuru fig-ya nāchaghi acha,

Osisi vine nile nāb͕awa okoko,

Ha esìpuwo ísì utọ ha.

Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.

14Gi ndurum, nke di na nb͕awa nkume di elu, n'ebe-nzuzo nke ebe di nkputankpu,

Me ka m'hu iru-gi, me ka m'nu olu-gi;

N'ihi na olu-gi nātọ utọ, iru-gi ma-kwa-ra nma.

15Nwuderenu ayi nkita-ọhia nile, bú nkita-ọhia di ntà, ndi nēmebi ubi-vine nile;

N'ihi na ubi-vine-ayi nāb͕awa okoko.

16Onye ihe-ya nātọm utọ bu nkem, mu onwem bu kwa nke ya:

Bú onye ahu nke nāzù ìgwè aturu-ya n'etiti urodi.

17Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n'ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa,

Chigharia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, me onwe-gi ka i yie mb͕ada ma-ọbu nwa-ele

N'elu ugwu nile nke Beta.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help