ABÙ ỌMA 77 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; dika Jeduthun si abù abù. Abù Ọma Esaf.

1Olum ka m'nēji etiku Chineke, m'gēti kwa nkpu;

Olum ka m'nēji etiku Chineke, Ọ gāṅakwam nti.

2N'ubọchi nkpab͕um Onye-nwe-ayi ka m'chọrọ:

Akam setiri eseti n'abali, o sinwukwaghi;

Nkpuru-obim juru ka akasie ya.

3M'gēcheta Chineke, su kwa ude nke-uku:

M'gātughari uchem, ọzọ, mọm adighi-enwe ike. Selah

4I jidere ndi-nche nke anyam abua:

Ọ b͕aram ghari, m'we ghara ikwu okwu.

5Echèrem èchìchè bayere ubọchi nile nke mb͕e ochie,

Bú arọ nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga, si,

6M'gēcheta abù m'nābù n'ikpọ ubọ-akwara n'abali:

M'gēso obim tughari uche;

Mọm we chọsie ike, si,

7Ọ̀ bu rue mb͕e nile ebighi-ebi ka Onye-nwe-ayi gāju aju?

Ọ̀ bu na ihem agaghi-atọ kwa Ya utọ ọzọ?

8Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya gwuchapuworo?

Ọ̀ gwusiwo, bú okwu-Ya, rue ọb͕ọ nile?

9Ọ̀ chezọwo ime amara, bú Chineke?

Ò kpuchitawo obi-ebere-Ya nile n'iwe? Selah

10M'we si, Ọriam ka nka bu;

Ma m'gēcheta arọ nile nke aka-nri nke Onye kachasi ihe nile elu.

11M'gēhota omume nile nke Ja;

N'ihi na m'gēcheta oké ọlu-Gi nile site na mb͕e ochie.

12M'gātughari kwa uche n'ọlu-Gi nile,

Ọ bu kwa n'omume-Gi nile ka m'gātughari obi.

13Chineke, n'idi-nsọ ka uzọ-Gi di:

Ònye bu chi uku dika Chineke?

14Gi onwe-gi bu Chineke Nke nālu oké ọlu:

I mewo ka amara ike-Gi n'etiti ndi nile di iche iche.

15I jiwo ogwe-aka-gi b͕aputa ndi-Gi,

Bú umu Jekob na Josef. Selah

16Miri huru Gi, Chineke;

Miri huru Gi, o nēb͕u ha nb͕u:

Ọzọ, ob͕u-miri nile mara jijiji.

17Igwe-oji nile wupuru miri;

Mbara-ígwé mere ka olu-ha da udà:

Ọzọ, àkú-gi nile nēfeghari.

18Olu nke éb͕è-elu-igwe-Gi di n'ifufe nēfeghari buruburu;

Àmùmà nyere elu-uwa dum madu bi ìhè:

Ala mere nkpatu ma kwa jijiji.

19N'oké osimiri ka uzọ-Gi di,

Uzọ-ije-Gi nile di kwa n'ọtutu miri,

Amaghi kwa nzọ-ukwu-Gi nile.

20I duru ndi-Gi dika ìgwè ewu na aturu,

Site n'aka Moses na Eron.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help