JOEL 3 - Bible Lgbo

1N'ihi na, le, na mb͕e ahu na n'oge ahu, mb͕e M'gēme ka ndi Juda na Jerusalem adọtara n'agha lata,

2M'gāchikọta mba nile, me ka ha rida na ndagwurugwu Jehoshafat; Mu na ha gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu bayere ndim na ihe-nketam, bú Israel, ndi ha chusaworo n'etiti mba nile, ọ bu kwa alam ka ha kère.

3Ọ bu kwa ndim ka ha fetaworo na nzà: ha we nye nwa-okoro iji b͕anwe nwanyi nākwa iko, nwa-mb͕ọ ka ha re-kwa-ra n'ihi manya-vine, ka ha we ṅua.

4Ọzọ kwa, gini ka unu gēmem, unu Taia na Zaidon na buruburu-ala nile nke Filistia? Ọ̀ di nmeso M'mesoworo unu unu onwe-unu nākwughachim, ma ọ̀ bu na ihe di unu onwe-unu nēmesom? M'gēji ngwa na ọsọ nyeghachi nmeso-unu n'isi-unu.

5Ebe ọ bu ọla-ọcham na ọla-edom ka unu wereworo, ebe ọ bu kwa ezi ihem nile anāchọsi ike ka unu chibàworo n'ulo uku nile unu;

6ebe ọ bu kwa umu Juda na umu Jerusalem ka unu nēre nye umu ndi Jevan, ka unu we me ka ha si n'ókè-ala-ha je n'ebe di anya:

7le, M'gaje isi n'ebe ahu ebe unu nērega ha-ri kpọte ha, nyeghachi nmesò-unu n'isi-unu;

8M'gēre kwa umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom nye n'aka umu Juda, ha ewe re ha nye ndi Sheba, bú mba di anya: n'ihi na Jehova ekwuwo.

9Kpọsanu nka n'etiti mba nile; donu agha nsọ: kpọtenu ndi-dike; ka ndi-agha nile biarue nso, rigota.

10Kpugharianu mma-ọgè-unu ka ha buru mma-agha, na mma-ikwa-osisi-unu ka ha buru ube: ka onye-ume-ngwu si, Dike ka m'bu.

11Menu ngwa, bia, unu mba nile ndi bi buruburu, chikọtanu onwe-unu: Jehova, me ka ndi-dike-Gi rida n'ebe ahu.

12Ka mba nile teta, rigota na ndagwurugwu Jehoshafat: n'ihi na n'ebe ahu ka M'gānọdu ikpe mba nile bi buruburu ikpe.

13Tiye mma-iwe-ihe-ubi, n'ihi na ihe agēwe n'ubi achawo: bianu, zọcha; n'ihi na ebe-nzọcha-nkpuru-vine ejuwo, ebe-inara-manya-vine nile erubigawo; n'ihi na ihe ọjọ ha bara uba.

14Ọtutu ìgwè madu, ọtutu ìgwè madu nime ndagwurugwu nkpebì-ikpe! n'ihi na ubọchi Jehova di nso nime ndagwurugwu nkpebì-ikpe.

15Anyanwu na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achikọpuwo kwa onwunwu-ha.

16Jehova gēsi kwa na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; elu-igwe na uwa gēme kwa nkpatu: ma Jehova gāburu ndi-Ya ebe-nb͕abà, Ọ gābu-kwa-ra umu Israel ebe siri ike.

17Unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Onye bi na Zaion, bú ugwu nsọm: Jerusalem ewe di nsọ, ndi ala ọzọ agaghi-agabiga kwa nime ya ọzọ.

18Ọ gēru kwa n'ubochi ahu, na ugwu nile ganābusa manya-vine utọ, miri-ara ganērù kwa n'ugwu ntà nile, miri ganērù kwa n'ebe nile nke Juda miri si erù; isi-iyi gēsi kwa n'ulo Jehova puta, de ndagwurugwu Shitim.

19Ijipt gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, Edom gāghọ kwa ọzara, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi ihe-ike emere umu Juda, n'ihi na ha awusiwo ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ala-ha.

20Ma Juda gābu ebe madu bi rue mb͕e ebighi-ebi, Jerusalem kwa rue ọb͕ọ na ọb͕ọ.

21M'gāgu kwa ọbara-ha n'ihe ikpe nāmaghi, bú nke M'nāgughi ya n'ihe ikpe nāmagh: n'ihi na Jehova nēbi nime Zaion.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help