II. NDI-EZE 16 - Bible Lgbo

1N'arọ nke-iri-na-asa nke Peka nwa Remalaia ka Ehaz nwa Jotam, bú eze Juda, malitere ibu eze.

2Orú arọ ka Ehaz b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: ma o meghi ihe ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-ya, dika Devid nna-ya.

3Ma o jere ije n'uzọ ndi-eze Israel. Ọzọ kwa, o mere ka nwa-ya nwoke gabiga nime ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.

4Ọ chua àjà, sure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu, na n'elu ugwu ntà nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula.

5Mb͕e ahu Rezin, bú eze Siria, na Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, rigoruru Jerusalem ibu agha: ha we nọchigide Ehaz n'agha, ma ha apughi ibu agha.

6Na mb͕e ahu ka Rezin, bú eze Siria, weghachiri Ilat nye Siria, chupu ndi-Ju n'Ilot: ndi Siria we ba n'Ilat, biri n'ebe ahu, rue ta.

7Ehaz we zigara Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, ndi-ozi, si, Orù-gi na nwa-gi ka m'bu: rigota, zọputam n'aka eze Siria na n'aka eze Israel, ndi nēbili imegidem.

8Ehaz we chiri ọla-ọcha na ọla-edo anāchọta n'ulo Jehova, na n'àkù nile nke ulo eze, zigara eze Asiria ka ọ buru ihe-iri-ngo.

9Eze Asiria we ge ya nti: eze Asiria we rigorue Damaskọs, were ya, me ka ndi-ya je biri na Kia, o me-kwa-ra ka Rezin nwua.

10Eze, bú Ehaz, we je izute Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, na Damaskọs, we hu ebe-ichu-àjà nke di na Damaskọs: eze, bú Ehaz, we zigara Uraija, bú onye-nchu-àjà, oyiyi ebe-ichu-àjà ahu, na ihe-atù-ya, dika ọlu nile aluru ya si di.

11Uraija, bú onye-nchu-àjà, we wue ebe-ichu-àjà ahu: dika ihe nile si di nke eze, bú Ehaz, siri na Damaskọs zite, otú a ka Uraija, bú onye-nchu-àjà, mere, rue mb͕e eze, bú Ehaz, siri na Damaskọs bia.

12Eze we si na Damaskọs bia, eze we hu ebe-ichu-àjà ahu: eze we biarue ebe-ichu-àjà ahu nso, sure àjà-nsure-ọku n'elu ya.

13Ọ we sure àjà-nsure-ọku-ya ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, sure kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, wusi kwa àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, wusa kwa ọbara àjà-udo-ya nile, n'elu ebe-ichu-àjà ahu.

14Ma ebe-ichu-àjà ọla ahu, nke di n'iru Jehova, o si n'iru ulo ahu, si n'etiti ebe-ichu-àjà-ya na ulo Jehova, bute ya nso, tiye ya n'akuku Ugwu ebe-ichu-àjà-ya.

15Eze, bú Ehaz, we nye Uraija, bú onye-nchu-àjà, iwu, si, N'elu ebe-ichu-àjà uku ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku ututu ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, na àjà-nsure-ọku nke eze, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, ha na àjà-nsure-ọku nke ndi nile nke ala nka, na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha; ọbara nile nke àjà-nsure-ọku, na ọbara nile nke àjà, n'elu ya ka i gāwusa kwa ya: ma ebe-ichu-àjà ọla ahu gādirim iji ju ase.

16Uraija, bú onye-nchu-àjà, we me ya, dika ihe nile si di nke eze, bú Ehaz, nyere ya n'iwu.

17Eze, bú Ehaz, we bipu ihe-njikọ nile nke ihe-ndọkwasi nile, si n'elu ha wezuga ite ọsisa-miri: o si-kwa-ra n'elu ehi ọla nke di n'okpuru ya weda oké osimiri ahu, tiye ya n'elu pavement nkume.

18Ma uzọ ekpuru ekpu nke ubọchi-izu-ike nke ha wuru n'ulo ahu, na nbata eze nke di n'èzí, ọ b͕anwere ha rue ulo Jehova, n'ihi eze Asiria.

19Ma ihe Ehaz nile nke fọduru nke o mere, èdeghi ihe ahu n'akukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?

20Ehaz we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Hezekaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help