EZIKIEL 40 - Bible Lgbo

1N'arọ nke-orú-na-ise nke emere ka ayi je biri n'ala ọzọ, n'isi-nmalite arọ ahu, n'ubọchi nke-isi nke ọnwa, n'arọ nke-iri-na-anọ site na mb͕e etikpọsiri obodo-ayi, n'otù ubọchi ahu, aka Jehova dim n'aru, O we me ka m'bia n'ebe ahu.

2N'ọhù di iche iche nke Chineke ka O mere ka m'bata n'ala Israel, Ọ dọbam n'ugwu di elu nke-uku, nke ihe dika obodo anēwu ewu di n'elu ya n'akuku Ndida.

3O we me ka m'bia n'ebe ahu, ma le, otù nwoke, ma ele ya anya ọ di ka ọla si di n'ile ya anya, eriri flax di kwa n'aka-ya, ya na amì eji atù ihe; onye ahu nēguzo kwa n'ọnu-uzọ-ama.

4Nwoke ahu we gwam okwu, si, Nwa nke madu, were anya-gi abua hu, were kwa nti-gi abua nu, tukwasi kwa obi-gi n'ihe nile Mu onwem nēme ka i hu; n'ihi na ọ bu ime ka i hu ha ka emeworo ka i bia ebe a: gosi ulo Israel ihe nile nke gi onwe-gi nāhu.

5Ma le, otù mb͕idi di n'èzí ulo ahu buruburu n'akuku nile, n'aka nwoke ahu ka amì eji atù ihe di kwa nke di cubit isi n'ogologo, cubit ọ bula bu otù cubit na otù ntù-ọbu-aka: o we tùa ib͕idi nke mb͕idi ahu anēwu ewu, otù ami; na idi-elu-ya, otù ami.

6O we biarue ọnu-uzọ-ama nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu, ọ rigo ihe-nrigo-ya, tùa nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu, otù ami n'obosara: ọbuná otù nbata-uzọ, otù ami n'obosara.

7Ime-ulo ọ bula bu otù ami n'ogologo, na otù ami n'obosara; n'etiti ime-ulo abua di cubit ise; nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama n'akuku uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo bu otù ami.

8O we tùa uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo, otù ami.

9O we tùa uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama, cubit asatọ; na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, cubit abua; uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo.

10Ime-ulo nke ọnu-uzọ-ama n'uzọ Iru-anyanwu di atọ n'otù akuku, atọ n'akuku nke-ọzọ; otù ọtùtù ka ha atọ nwere: ọ bu kwa otù ọtùtù ka akuku-ọnu-uzọ abua nwere n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ.

11O we tùa obosara nke oghere ọnu-uzọ-ama, cubit iri; na ogologo nke ọnu-uzọ-ama, cubit iri-na-atọ;

12na ókè-ala n'iru ime-ulo nile, otù cubit n'otù akuku, na ókè-ala, otù cubit n'akuku nke-ọzọ; na ime-ulo onwe-ya, cubit isi n'otù akuku na cubit isi n'akuku nke-ọzọ.

13O we tùa ọnu-uzọ-ama site n'elu-ulo nke otù ime-ulo rue elu-ulo nke ime-ulo-ibe-ya, obosara-ya di orù cubit na ise; oghere na ncherita-iru oghere.

14O we me akuku-ọnu-uzọ, ọgu cubit atọ; ọbuná rue akuku-ọnu-uzọ nke ogige, ọnu-uzọ-ama di buruburu n'akuku nile.

15Ọzọ, site n'iru ọnu-uzọ-ama, na nbata, rue iru uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama di nime di ọgu cubit abua na iri.

16Ọzọ, window emechiri emechi diri ime-ulo nile, di-kwa-ra akuku-ọnu-uzọ nile ha n'ime ọnu-uzọ-ama buruburu n'akuku nile, otú a ka window di-kwa-ra ulo-nbata nile: window di kwa n'ime ulo buruburu n'akuku nile: nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ ọ bula.

17O we me ka m'bata n'ogige di n'èzí, ma, le, ime-ulo di iche iche na pavement di, nke emeworo nye ogige ahu buruburu n'akuku nile: orú ime-ulo na iri di na pavement ahu.

18Pavement ahu di kwa n'akuku ọnu-uzọ-ama nile, na nso ogologo nke ọnu-uzọ-ama, bú pavement nke dikari ala.

19O we tùa obosara-ya site n'iru ọnu-uzọ-ama ahu nke dikari ala rue iru nke ogige di nime n'èzí, ọgu cubit ise, n'akuku Iru-anyanwu na n'akuku Ugwu.

20Ọnu-uzọ-ama ahu kwa nke nēche iru n'uzọ Ugwu, bú ọnu-uzọ-ama nke ogige di n'èzí, o tùru ogologo-ya na obosara-ya.

21Ime-ulo-ya di atọ n'otù akuku, atọ n'akuku nke-ọzọ; akuku-ọnu-uzọ-ya abua na ulo-nbata-ya nile di ka ọtùtù nke ọnu-uzọ-ama mbu: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

22Window-ya nile na ulo-nbata-ya nile na nkwu-ya nile di kwa ka ọtùtù nke ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu; ọ bu kwa ihe-nrigo nke nwere nzọ-ukwu asa ka ha ji arigo nime ya; ulo-nbata-ya nile di kwa n'iru ha.

23Otù ọnu-uzọ-ama di-kwa-ra ogige di nime na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama ọzọ, n'akuku Ugwu na n'akuku Iru-anyanwu; o we tùa site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ, ọgu cubit ise.

24O we me ka m'je n'uzọ Ndida, ma le, otù ọnu-uzọ-ama di n'uzọ Ndida: o we tùa akuku-ọnu-uzọ-ya abua na ulo-nbata-ya nile dika ọtùtù ndia si di.

25Window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n'akuku nile, dika window ndia: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

26Ihe-nrigo nke nwere nzọ-ukwu asa di kwa iji arigo ya, ulo-nbata-ya nile di kwa n'iru ha: o nwe-kwa-ra nkwu, otù n'otù akuku, otù n'akuku nke-ọzọ, n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua.

27Otù ọnu-uzọ-ama di-kwa-ra ogige di nime n'uzọ Ndida: o we tùa site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ n'uzọ Ndida, ọgu cubit ise.

28O we me ka m'si n'ọnu-uzọ-ama nke Ndida ba n'ogige di nime: o we tùa ọnu-uzọ-ama nke Ndida dika ọtùtù ndia si di;

29na ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile, dika ọtùtù ndia si di: window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n'akuku nile: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

30Ulo-nbata di kwa ya buruburu n'akuku nile, ogologo-ha di orú cubit na ise, obosara-ha di kwa cubit ise

31Ulo-nbata-ya nile chere iru n'ogige di n'èzí; nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua: nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo-ya nwere.

32O we me ka m'bata n'ogige di nime n'uzọ Iru-anyanwu: o we tùa ọnu-uzọ-ama ahu dika ọtùtù ndia si di:

33na ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile, dika ọtùtù ndia si di: window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n'akuku nile: ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

34Ulo-nbata-ya nile che-kwa-ra iru n'ogige di n'èzí; nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua, n'otù akuku na n'akuku ọzọ: ọ bu kwa nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo-ya nwere.

35O we me ka m'biarue ọnu-uzọ-ama nke Ugwu, o we tùa ya dika ọtùtù ndia si di;

36ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile; window di-kwa-ra ya buruburu n'akuku nile: ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

37Akuku-ọnu-uzọ-ya abua chere iru n'ogige di n'èzí; nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua, n'otù akuku, na n'akuku ọzọ: ọ bu kwa nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo nwere.

38Otù ime-ulo na ọnu-uzọ-ya di kwa n'akuku-ọnu-uzọ n'ọnu-uzọ-ama nile; n'ebe ahu ka ha nāsacha anu àjà-nsure-ọku.

39Ọzọ, n'ulo-nbata nke ọnu-uzọ-ama ka table abua di n'otù akuku, table abua di kwa n'akuku nke-ọzọ, ha ewe b͕ue n'elu ha àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie na àjà-ikpe-ọmuma.

40Ọzọ, n'otù akuku n'èzí, ebe madu nārigoru oghere nke ọnu-uzọ-ama n'akuku Ugwu, ka table abua di; ọ bu kwa n'akuku ọzọ, nke diri uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama, ka table abua di.

41Table anọ di n'otù akuku, table anọ di kwa n'akuku nke-ọzọ, n'akuku ọnu-uzọ-ama; ha di table asatọ nke ha nēb͕u ihe nchu-àjà n'elu ha.

42Table anọ di-kwa-ra àjà-nsure-ọke, nke nkume awara awa, ogologo-ha di otù cubit na nkera, obosara-ha di kwa otù cubit na nkera, idi-elu-ha di kwa otù cubit: n'elu ha ka ha nādọba kwa ihe nile nke ha ji eb͕u anu àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ.

43Nko nke ra ka otù ntù-ọbu-aka di kwa, nke akpọgidesiri ike nime ulo-nbata buruburu n'akuku nile: ọ bu kwa n'elu table nile ahu ka anu nke onyinye iji biaru nso di.

44Ọzọ, n'èzí ọnu-uzọ-ama di nime ka ime-ulo nke ndi-abù di n'ogige di nime, nke di n'akuku ọnu-uzọ-ama nke Ugwu; iru-ha di kwa n'uzọ Ndida: otù di n'akuku ọnu-uzọ-ama nke Iru-anyanwu nke iru-ya di n'uzọ Ugwu.

45O we gwam okwu, si, Ime-ulo a, nke iru-ya di n'uzọ Ndida, diri ndi-nchu-àjà ahu, ndi nēdebe ihe-ndebe nke ulo a.

46Ma ime-ulo a nke iru-ya di n'uzọ Ugwu diri ndi-nchu-àjà ahu, ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-ichu-àjà: ndia bu umu Zedok, ndi si n'etiti umu Livai abiakute Jehova nso ijere Ya ozi.

47O we tùa ogige ahu, ogologo-ya di ọgu cubit ise, obosara-ya di kwa ọgu cubit ise, o nwere akuku anọ ra nrata; ebe-ichu-aja di kwa n'iru ulo ahu.

48O we me ka m'biarue uzọ-nbata nke ulo ahu, o we tùa akuku-ọnu-uzọ nke uzọ-nbata ahu, cubit ise n'otù akuku, cubit ise n'akuku nke-ọzọ: obosara ọnu-uzọ-ama di kwa cubit atọ n'otù akuku, cubit atọ n'akuku nke-ọzọ.

49Ogologo uzọ-nbata ahu di orú cubit, obosara-ya di kwa cubit iri na otù; ọbuná n'ihe-nrigo ahu nke ha ji arigo ya: ogidi di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua, otù n'otù akuku, otù n'akuku ọzọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help