ABÙ ỌMA 39 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù, bú Jedutun. Abù Ọma Devid.

1Asirim, Ka m'lezie uzọm nile anya,

Ka m'we ghara iwere irem mehie:

Ka m'debere ọnum ihe ikechi ọnu,

Mb͕e onye nēmebi iwu nọ n'irum.

2Aghọrọm onye-ob͕i n'inọ-dū, ab͕aram nkiti, ọbuná ipu n'ikwu ezi ihe;

Ewe kpalie ihe-nb͕um.

3Obim di ọku nimem;

Mb͕e m'nātughari uche ọku rebere:

M'we were irem kwue okwu:

4Jehova, me ka m'mara ọgwugwum,

Na ọtùtù ubọchim nile, ihe ọ bu;

Ka m mara ka msi buru ihe nākwusi akwusi.

5Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka;

Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n'iru Gi:

N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n'iguzosi-ike-ya. Selah

6N'ezie ọ bu n'onyinyo ka madu nējeghari:

N'ezie n'otù nku-ume ka ha nāb͕a aghara:

Ọ nākwakọba àkù, ma ọ maghi onye gāchikọta ha.

7Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi, m'leworo anya gini?

Ncherem, n'ebe I nọ ka ọ di.

8Naputam n'aka njehiem nile:

Emelam ka m'buru ihe-ita-uta nke onye-nzuzu.

9Aghọrọm onye-ob͕i, adighm-asaghe ọnum;

N'ihi na Gi onwe-gi mere ya.

10Si n'arum wezuga ihe-otiti-Gi:

Emewo ka mu onwem gwusia site n'ilu-ọ̀gù nke aka-Gi.

11I ji iba-nba nile dọ madu aka na nti n'ihi ajọ omume,

I we me ima-nma-ya anāchọsi ike ka ọ b͕aze dika nla:

N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu. Selah

12Nuru ekperem, Jehova, ṅa kwa nti ntikum;

Ab͕ala nkiti n'anya-mirim:

N'ihi na ọbìa ka m'bu n'ebe I nọ,

Abum onye-nnọdu, dika nnam-hà nile.

13Lepum anya, ka m'we b͕asa irum,

Tutu mu ala, ghara inọ kwa ọzọ n'uwa.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help