EZIKIEL 31 - Bible Lgbo

1O rue, n'arọ nke-iri-na otù, n'ọnwa nke-atọ, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,

2Nwa nke madu, Si Fero, bú eze Ijipt, si kwa ìgwè ndi-ya; Ònye ka i yiri n'idi-uku-gi?

3Le, Asiria bu osisi cedar nime Lebanon nke nwere ngalaba mara nma, na ọtutu alaka nēnye ǹdò, na ogologo di elu; ọ bu kwa n'etiti alaka b͕ara ọhia ka ọnu-ọnu-ya di.

4Miri mere ya ka o bùe ibù, ob͕u-miri mere ya ka ọ di elu: osimiri-ya nile nāga ebe-ya akuku ihe buruburu; uzọ-miri-ya nile ka o zigara osisi nile nke ọhia.

5N'ihi nka ka ogologo-ya di elu kari osisi nile nke ọhia; eme-kwa-ra ka ngalaba-ya ba uba, alaka-ya nile to-kwa-ra ogologo site n'ọtutu miri, mb͕e ọ waputara ha.

6Na ngalaba-ya nile ka anu-ufe nile nke elu-igwe luru akwu, ọ bu kwa n'okpuru alaka-ya nile ka anu ọhia nile muru umu, ọ bu kwa na ǹdò-ya ka oké mba nile biri.

7Ọ we ma nma n'idi-uku-ya, n'ogologo nke alaka-ya nile: n'ihi na nkpọrọgwu-ya adiwo n'ebe ọtutu miri di.

8Osisi cedar nile nke di n'ubi Chineke ab͕ara ogige ezoghi ya: osisi fir nile eyighi ngalaba-ya nile, osisi plane nile adighi kwa ka alaka-ya nile; ọ dighi kwa osisi ọ bula nke di n'ubi Chineke ab͕ara ogige nke yiri ya n'ima-nma-ya.

9Ihe nke mara nma ka M'mere ya ka ọ ghọ n'iba-uba nke alaka-ya: osisi nile nke Iden, nke di n'ubi Chineke nke ab͕ara ogige, we kwoso ya ekworo.

10N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i di elu n'ogologo, na n'ihi na o tiyewo ọnu-ọnu-ya n'etiti alaka b͕ara ọhia, na n'ihi na obi-ya di elu n'idi-elu-ya;

11M'gēnye kwa ya n'aka onye di ike nke mba nile; ọ ghaghi imeso ya: n'ihi nmebi-iwu-ya ka M'chupuworo ya.

12Ndi ala ọzọ, bú ndi kariri mba nile n'ime ka madu ma jijiji, we bipu ya, tusa ya: n'elu ugwu nile na nime ndagwurugwu nile ka alaka-ya daworo, ewe nyajie alaka-ya nile nke akwukwọ-ha kpuchiri ha n'ebe nile miri si erù nke ala-ya; ndi nile nke ala ahu esiwo kwa na ǹdò-ya rida, ha we tusa ya.

13N'elu ihe-ya dara ada ka anu-ufe nile nke elu-igwe gēbi, ọ bu kwa n'alaka-ya nile ka anu ọhia nile gādi:

14ka osisi nile nke miri we ghara idi elu n'ogologo-ha, ghara kwa itiye ọnu-ọnu-ha rue etiti alaka b͕ara ọhia, ka ndi-ha ndi di ike we ghara iguzo n'idi-elu-ha, bú ndi nile nāṅu miri: n'ihi na ha nile ka ewereworo nye ọnwu, ijeru ala di n'okpuru uwa, n'etiti umu nke madu, ijekuru ndi nārida n'olùlù.

15Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi mb͕e ọ ridaruru n'ala-mọ emerem ka erue újú: ekpuchirim ob͕u-miri n'ihi ya, eb͕ochi-kwa-ram osimiri-ya nile, ewe b͕ochibido ọtutu miri: eme-kwa-ram ka Lebanon yiere ya uwe-nkpe, osisi nile nke ọhia tubọ-kwa-ra atubọ n'ihi ya.

16Emerem ka mba nile me nkpatu site n'olu nke ọdida-ya, mb͕e M'mere ka ọ ridarue ala-mọ, ya na ndi nārida n'olùlù: ewe kasie osisi nile nke Iden obi n'ala di n'okpuru uwa, bú osisi arọputara arọputa kachasi kwa nma na Lebanon, ndi nile nke nāṅu miri.

17Ha onwe-ha so-kwa-ra ya ridarue ala-mọ, jekuru ndi ejiri mma-agha b͕u; e, ndi bu ogwe-aka-ya, ndi biri na ǹdò-ya n'etiti mba nile.

18Ònye ka i yiri otú a nime nsọpuru na n'idi-uku n'etiti osisi nile nke Iden? ma emewo ka i rida, gi na osisi nile nke Iden, rue ala di n'okpuru uwa: n'etiti ndi anēbighi úgwù ka i gēdina, gi na ndi ejiri mma-agha b͕u. Nka bu Fero-na ìgwè ndi-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help