EMOS 2 - Bible Lgbo

1Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Moab, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na o surere ọkpukpu eze Edom me ka ha ghọ nzu:

2ma M'gēzite ọku na Moab, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Keriot; Moab gānwu kwa anwu na nkpọtu, na n'iti-nkpu agha, na n'olu opì-ike:

3M'gēbipu kwa onye-ikpe n'etiti ya, b͕ue ya na ndi-isi-ya nile; otú a ka Jehova siri.

4Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Juda, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha juworo iwu Jehova, ọ bu kwa ukpuru-Ya nile ka ha nēdebeghi, okwu-ugha-ha nile, nke ndi bu nna-ha jeroso, we dufue ha:

5ma M'gēzite ọku na Juda, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Jerusalem.

6Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Israel, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha reworo onye ezi omume n'ọla-ọcha, re kwa ob͕eye n'ihi akpukpọ-ukwu abua:

7ha bu ndi nēghekpọso ájá ala n'isi ndi nēnweghi ike, ọ bu kwa uzọ ndi di ume-ala n'obi ka ha nēwezuga: ọzọ, nwoke na nna-ya nējekuru otù nwa-ab͕ọghọ ahu, ka ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ:

8ọ bu kwa n'elu uwe anaraworo n'ihe-ibe ka ha nēseti onwe-ha n'akuku ebe-ichu-aja nile ọ bula, ọ bu kwa manya-vine nke ndi eriworo ha nra ka ha nāṅu n'ulo Chineke-ha.

9Ma Mu onwem kpochapuru ndi-Amorait n'iru ha, onye idi-elu-ya di ka idi-elu osisi cedar, onye di ike ka ọ bu kwa, dika osisi oak; ma ekpochapurum nkpuru-ya n'elu na nkpọrọgwu-ya nile n'okpuru.

10Ọ bu kwa Mu onwem mere ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, M'me-kwa-ra ka unu je ije n'ọzara ọgu arọ abua, ka unu we nweta ala ndi-Amorait.

11Eme-kwa-ram ka ufọdu nime umu-unu bilie ibu ndi-amuma, ufọdu nime umu-okorọbia-unu kwa, ibu ndi-Nazirait. Ọ̀ bughi nọ̄ ezie, bú nka, unu umu Israel? Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

12Unu we me ka ndi-Nazirait ṅua manya-vine; ọ bu kwa ndi-amuma ka unu nyere iwu, si, Unu ebula amuma.

13Le, Mu onwem gābiada unu n'ọnọdu-unu, dika ub͕ọ-ala nke juputara n'ùkwù ọka si abiada.

14Ebe-nb͕alaga gālanari kwa onye ukwu ọsọ n'iyì, onye di ike agaghi-ab͕a kwa ike-ya ume, dike agaghi-ewepuga onwe-ya:

15onye nāchi uta agaghi-eguzo kwa; onye ukwu-ya abua di nfe n'ib͕a ọsọ agaghi-ewepuga kwa onwe-ya: onye nānọkwasi n'inyinya agaghi-ewepuga kwa onwe-ya:

16onye obi-ya nwere ume n'etiti ndi-dike gāb͕a ọtọ b͕alaga n'ubọchi ahu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help