ABÙ ỌMA 92 - Bible Lgbo

Abù Ọma, bú Abù diri ubọchi-izu-ike.

1Ọ bu ezi ihe ikele Jehova ekele,

Na ibùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu:

2Igosi ebere-Gi n'ututu,

Igosi kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi kwa-abali,

3Nēji ubọ nke akwara iri, nēji kwa une;

Nēji higgaion n'elu ubọ-akwara.

4N'ihi na I mewo ka m'ṅuria site n'ọlu-Gi, Jehova:

Ọ bu n'ọlu nile nke aka-Gi ka m'gēti nkpu ọṅù.

5Le ka ọlu-Gi nile si di uku, Jehova!

Èchìchè-Gi miri emi nke-uku.

6Madu nke bu anu-ọhia adighi-ama ama;

Onye-nzuzu adighi-aghọta kwa nka:

7Mb͕e ndi nēmebi iwu nāma akwukwọ dika ihe-ọkukú,

Mb͕e ndi nile nke nalu ajọ ihe nāwa kwa okoko-osisi;

Ọ bu ka ewe kpochapu ha rue mb͕e nile ebighi-ebi:

8Ma Gi onwe-gi nọ n'ebe di elu rue mb͕e ebighi-ebi, Jehova.

9N'ihi na, le, ndi-iro-Gi, Jehova,

N'ihi na, le, ndi-iro-Gi gāla n'iyì;

Ndi nile nke nālu ajọ ihe gēkesa onwe-ha.

10Ma I mewo ka mpim di elu dika mpi atu:

Ejiwo manu ọhu wusam.

11Anyam elekwasiwo kwa ndi nēchem anwu,

Ihe bayere ndi nēbili imegidem, bú ndi nēme ihe ọjọ, ka ntim abua nānu.

12Onye ezi omume gāwa igù dika nkwu:

Dika osisi cedar nime Lebanon ka o gēbù ibù.

13Ndi akuworo n'ulo Jehova dika osisi

Gāma akwukwọ n'ogige nile nke Chineke-ayi.

14Ha gānọ nāmi nkpuru n'isi-awọ;

Osisi nke miri di ha n'aru ri nne, nke nwezu-kwa-ra akwukwọ ndu, ka ha gābu.

15Igosi na Jehova zirí ezi;

Ọ bu oké nkumem, ọ dighi kwa ajọ omume di nime Ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help