HOSEA 2 - Bible Lgbo

1Sinu umu-nne-unu ndikom, Ami; si-kwa-nu umu-nne-unu ndinyom, Ruhama.

2Unu na nne-unu kpe ikpe, kpenu; n'ihi na ya onwe-ya abughi nwunyem, Mu onwem abughi kwa di-ya: ya wezuga ikwa-iko-ya nile n'iru ya, ya wezuga kwa ikwa-iko nile nke nwanyi nwere di ọ nākwa n'etiti ara-ya abua;

3ka M'we ghara iyipu uwe-ya b͕aba ya ọtọ, guzo ya dika n'ubọchi amuru ya, me ya dika ọzara, do ya ka ala ọkpọ-nku, were akpiri-ikpọ-nku me ka ọ nwua;

4ọ bu kwa n'aru umu-ya ndikom ka M'nāgaghi-enwe obi-ebere; n'ihi na umu-ndikom amuru n'ikwa-iko ka ha bu.

5N'ihi na nne-ha akwawo iko: nwanyi nke turu ime ha emewo ihe-ihere: n'ihi na ọ siri, Ka m'jeso ndi nāhum n'anya, ndi nēnyem nrim na mirim na aji-anum na flax nkem na manum na ihe-ọṅuṅum.

6N'ihi nka, le, M'gaje iji ogwu b͕achi uzọ-gi, M'gāb͕achibido kwa ya ogige, o we ghara ichọputa okporo-uzọ-ya nile.

7Ọ gāb͕aso kwa ndi nāhu ya n'anya, ma ọ gaghi-eru ha aru; ọ gāchọ kwa ha, ma ọ gaghi-achọta ha: o we si, Ka m'je laghachikuru dim mbu; n'ihi na ọ dim nma mb͕e ahu kari ub͕u a.

8Ma ya onwe-ya amaghi na ọ bu Mu onwem nyere ya ọka-ya na manya-vine ọhu ya, na manu ọhu ya, me ka ọla-ọcha na ọla-edo bara ya uba, bú nke ha ji mere Beal ihe.

9N'ihi nka ka M'gānaghachi ọkam na mb͕e-ya, na manya-vine ọhum na mb͕e-ya akara àkà, M'gānaputa kwa aji-anum na flax nkem nke enyere ikpuchi ọtọ-ya.

10Ma ub͕u a ka M'gēkpughe ọtọ-ya n'anya ndi nāhu ya n'anya, ọ dighi kwa onye ọ bula gānaputa ya n'akam.

11M'gēme kwa ka obi-utọ ya nile kwusi, ya na ememe-ya, na ọnwa ọhu ya, na ubọchi-izu-ike-ya, na mb͕e-ya nile akara àkà.

12M'gēme kwa ka osisi vine ya na osisi fig ya tọb͕ọrọ n'efu, nke ọ siworo, Onyinye ka ndia burum, nke ndi nāhum n'anya nyeworom: M'gēme kwa ha ka ha ghọ oké ọhia, anu ọhia ewe rie ha.

13M'gēji kwa ubọchi nile nke Bealim leta ya, bú ndi ọ nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, chiri nb͕a-aka-imi-ya na ihe-ichọ-nma-ya ke onwe-ya, jeso ndi nāhu ya n'anya, ma Mu ka o chezọrọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

14N'ihi nka, le, Mu onwem gaje iràra ya, me ka ọ je n'ọzara, M'gāgwa kwa ya okwu nke gābà ya n'obi.

15M'gēsi kwa n'ebe ahu nye ya ubi-vine-ya nile, na ndagwurugwu Ekoa ibu ọnu-uzọ olile-anya: ọ gāza kwa n'ebe ahu, dika n'ubọchi nile ọ di na nwata, na dika n'ubọchi o siri n'ala Ijipt rigoputa.

16Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na i gākpọm Chi; i gaghi-akpọkwam Beal ọzọ.

17M'gēwezuga kwa aha nile nke Bealim n'ọnu-ya, agaghi-ehota kwa ha n'aha-ha ọzọ.

18N'ubọchi ahu Mu na anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe na ihe nākpu akpu nke ala gāb͕ara ha ndu: ọ bu kwa uta na mma-agha na agha ka M'gāb͕ajipu n'ala-ha, me ka ha dina ala na ntukwasi-obi.

19M'gēkwere kwa ilu gi n'Onwem rue mb͕e ebighi-ebi; e, M'gēkwere ilu gi n'Onwem n'ezi omume, na n'ikpé, na n'ebere, na n'obi-ebere nile.

20M'gēkwere kwa ilu gi n'Onwem n'ikwesi-ntukwasi-obi: i we mara, Jehova.

21O gēru kwa n'ubọchi ahu na M'gāza, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gāza elu-igwe, ha onwe-ha gāza kwa ala;

22ala gāza kwa ọka-ya na manya-vine ọhu ya na manu ọhu ya; ha onwe-ha gāza kwa Jezreel.

23M'gāgha-kwa-ra ya Onwem n'ala-ya dika nkpuru ọghigha; M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru Lo-ruhama; M'gāsi kwa Lo-ami, Ndim ka i bu; ndi ahu gāsi kwa, Chinekem.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help