AISAIA 38 - Bible Lgbo

1Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na onye nānwu anwu ka i bu, I gaghi-adi kwa ndu.

2Hezekaia we chigharia iru-ya che mb͕idi iru, kpere Jehova,

3si, Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.

4Okwu Jehova we rue Aisaia nti, si,

5Je, si Hezekaia, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M'nātukwasi arọ iri na ise n'ubọchi-gi.

6M'gānaputa kwa gi na obodo a n'ọbu-aka eze Asiria, b͕ochi kwa obodo a.

7Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama sitere n'aka Jehova, na Jehova gēme ihe a nke O kwuru:

8le, M'nēme ka onyinyo nke di n'ebe-nrigo, nke ridaworo n'ebe-nrigo Ehaz site n'anyanwu, ka ọ la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri. Anyanwu we la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri n'ebe-nrigo ahu nke ọ ridaworo n'elu ya.

9Odide-akwukwọ nke Hezekaia eze Juda, mb͕e ọ riara ọria, o we puta N'ọrìa-ya nwe aru-ike.

10Mu onwem siri, Ọ bu n'idi-jū nke ubọchim nile ka m'ghaghi ila n'ọnu-uzọ-ama nke ala-mọ.

Anapuwom arọm fọduru afọdu.

11Asirim, M'gaghi-ahu Ja, ọbuná Ja n'ala ndi di ndu:

M'gaghi-elegide kwa madu anya ọzọ n'etiti ndi bi n'ala ọgwugwu-ndu.

12Emewo ka ebe-obibim bulie ije, esiwo kwa n'ebe m'nọ bulaga ya dika ulo-ikwū onye-ọzùzù-aturu:

Apiakọtawom ndum dika ọkpa-ákwà si apiakọta ákwà; na ǹkwé-ákwà ka Ọ gēbipum:

Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia.

13Edozirim nkpuru-obim rue ututu; dika ọdum, otú a ka Ọ nānyaji ọkpukpum nile:

Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia.

14Dika eleke ma-ọbu ub͕ala, otú a ka m'nēbe ebe;

Anamekwo ákwá dika nduru: anyam abua atalatawo n'ile anya n'elu;

Jehova, anēmeb͕um emeb͕u, nọrọm mbe.

15Gini ka m'gēkwu? Ọ gwaram okwu, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya:

M'ganēje nwayọ arọm nile n'ihi idi-ilu nke nkpuru-obim.

16Onye-nwe-ayi, ihe ndia ka madu ji adi ndu,

Ọ bu kwa nime ha ka ndu mọm dichasi:

I gēme kwa ka aru dim ike; Gi me kwa ka m'di ndu.

17Le, ihe m'ji nwe ihe di ilu ilu bu ka m'we nata udo:

Ma Gi onwe-gi huru nkpuru-obim n'anya si-ike, we si n'olùlù nke itọb͕orọ-n'efu dọputam:

N'ihi na I tufuru nmehiem nile n'azu Gi.

18N'ihi na ala-mọ adighi-ekele Gi, ọnwu adighi-eto Gi:

Ndi nārida n'olùlù adighi-ele anya ezi-okwu-Gi.

19Onye di ndu, onye di ndu, onye ahu gēkele Gi, dika m'si eme ta:

Nna gēme ka umu mara ezi-okwu-Gi.

20Jehova ejikerewo izọputam:

Ubọ-akwaram nile ka ayi ganākpọ

Ubọchi nile nke ndu-ayi n'ulo Jehova.

21Aisaia we si, Ka ha were mbadamba fig, makwasi ya n'elu ihe-ofifi ahu, ọ gādiri ndu.

22Hezekaia we si, Gini gābu ihe-iriba-ama na m'gārigoru ulo Jehova n'ubọchi nke-atọ?

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help