EZIKIEL 6 - Bible Lgbo

1Okwu Jehova we ruem nti, si,

2Nwa nke madu, che iru-gi n'ugwu nile nke Israel, bu amuma megide ha,

3si, Unu ugwu Israel, nurunu okwu Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ugwu nile na ugwu ntà nile na ebe nile miri si erù na ndagwurugwu nile: Le, Mu onwem nēme ka mma-agha biakwasi unu, M'gēme kwa ka ha la n'iyì, bú ebe nile unu nke di elu.

4Agēme kwa ka ebe-ichu-àjà nile unu tọb͕ọrọ n'efu, agētipia kwa arusi-anyanwu nile unu: M'gēme kwa ka ndi-unu eb͕uru eb͕u da n'iru arusi nile unu.

5M'gātọb͕ọ kwa ozu nile nke umu Israel n'iru arusi nile ha; M'gātusa kwa ọkpukpu-unu buruburu ebe-ichu-àjà nile unu.

6N'ebe-obibi nile unu ka agēme ka obodo nile ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe nile di elu gātọb͕ọ kwa n'efu; ka ebe-ichu-àjà nile unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, tọb͕ọrọ kwa n'efu, ka ewe tipia kwa arusi nile unu, ha ewe kwusi, ka ewe b͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, hichapu ọlu nile unu.

7Onye eb͕uru eb͕u gāda kwa n'etiti unu, unu we mara na Mu onwem bu Jehova.

8Ma M'gēme ka madu ufọdu fọdu, ọ bu na unu gēnwe ndi b͕apuru na mma-agha n'etiti mba nile, mb͕e unu gāb͕asa n'ala nile.

9Ndi-unu b͕apuru ab͕apu gēcheta kwa Mu onwem n'etiti mba nile ebe adọtara ha n'agha, mb͕e M'tiwaworo obi-ha nke nākwa iko, nke siworo n'ebe M'nọ wezuga onwe-ya, na anya-ha, nke nākwaso arusi nile ha iko: ha gāsọ kwa onwe-ha oyi n'iru ha n'ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo n'ihe-árú nile ha.

10Ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova: ọ bughi n'efu ka M'kwuworo okwu, si na M'gēme ha ihe ọjọ a.

11Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri: Kua ọbu-aka-gi, zọ kwa ukwu-gi n'ala, si, Éwù! n'ihi ihe-árú ọjọ nile nke ulo Israel: n'ihi na ha gēsite na mma-agha, site kwa n'oké unwu, site kwa n'ajọ ọria nke nēfe efe, da.

12Onye nọ n'ebe di anya gēsite n'ajọ ọria nēfe efe nwua; onye nọ nso gēsite na mma-agha da; onye fọduru nke anānọchigide kwa n'agha gēsite n'oké unwu nwua: M'we mezue ọnumam n'aru ha.

13Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e ndi-ha eb͕uru eb͕u di n'etiti arusi nile ha buruburu ebe-ichu-àjà nile ha, n'ugwu ntà ọ bula di elu, na n'elu ugwu nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, na n'okpuru osisi terebinth ọ bula b͕ara ọhia, bú ebe ha nyere arusi nile ha ihe ísì utọ.

14M'gēseti kwa akam n'aru ha, me ka ala-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, site n'ọzara rue Dibla, n'ebe-obibi nile ha: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help