ABÙ ỌMA 60 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Shushan Eduth: Michtam Devid, izí ihe: mb͕e ọ lusoro Eram-naharaim, luso kwa Eram-zoba, ọ̀gù, Joab we laghachi, tib͕ue Edom nime Ndagwurugwu Nnú, orú nnù madu na nnù iri.

1Chineke, I juwo ayi aju, I tiwawo ayi,

I wewo iwe; I gēme ka ayi laghachi ọzọ.

2I mewo ka ala ma jijiji; I b͕awawo ya:

Mezie ntiwa-ya nile; n'ihi na o mewo nkpatu.

3I mewo ka ndi-Gi hu ihe siri ike:

I mewo ka ayi ṅua manya nke isu-ngọngọ.

4I nyewo ndi nātu egwu Gi ọkọlọtọ,

Ka ewe welie ya elu dika ọkọlọtọ n'ihi ezi-okwu. Selah

5Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya,

Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi.

6Chineke ekwuwo okwu n'di-nsọ-Ya; ka m'ṅuria ọṅu-agha:

M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot.

7Mu nwe Gilead, ọ bu kwa mu nwe Manase;

Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim;

Juda bu nkpa-n'aka-ezem.

8Moab bu ite ọsisa-arum;

N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum:

Filistia, tie nkpu n'ihim.

9Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike?

Ònye duruworom rue Edom?

10Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke, juworo ayi aju?

I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha ayi, Chineke.

11Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u:

N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu.

12Nime Chineke ayi ga-eme ihe dìnkpà:

Ọ bu kwa Ya onwe-ya gāzọda ndi nākpab͕u ayi

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help