ABÙ ỌMA 43 - Bible Lgbo

1Kpem ikpe, Chineke, kpe kwa ọnum n'ikpe, me ka m'pua n'aka mba nādighi-eme ebere:

Me ka m'si n'aka nwoke bu onye-aghughọ na onye ajọ omume b͕apu.

2N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke Nke bu ebem siri ike; n'ìhi gini ka I juworom aju?

N'ihi gini ka m'nējeghari nēyi uwe-nkpe nime nmeb͕u onye-iro?

3Ziputa ìhè-Gi na ezi-okwu-Gi; ka ha onwe-ha nēdum:

Ka ha me ka m'biarue ugwu nsọ Gi,

Biaru kwa ebe-obibi-Gi nile.

4M'gābiaru kwa ebe-ichu-àjà nke Chineke,

Rue Chineke aru, bú ọṅù nke otite-egwú-ọṅùm:

M'gēkele kwa Gi n'ubọ-akwara, Chineke, bú Chinekem.

5Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim?

Gini mere i ji su ude nke-uku nimem?

Chere Chineke: n'ihi na m'gēkele kwa Ya ọzọ,

Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help