EKLISIASTIS 6 - Bible Lgbo

1Ihe ọjọ di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, ihe riri nne ka ọ bu kwa n'aru madu:

2madu onye Chineke nēnye àkù na ihe-nkpakọta na nsọpuru, ọ dighi kwa ihe kọnariri nkpuru-obi-ya nime ihe nile nke ọ nāchọsi ike, ma Chineke adighi-eme ka o nwe ike iri nime ya, kama onye ala ọzọ nēri ya; nka bu ihe-efu, ọria ọjọ ka ọ bu kwa.

3Ọ buru na nwoke amuta ọgu umu ise, di kwa ndu ọtutu arọ, ubọchi nke arọ-ya ewe ba uba, ma afọ adighi-eju nkpuru-obi-ya n'ezi ihe, ọzọ kwa, ọ dighi olìlì diri ya; asiwom, na nwa amukworo amukwo di nma kari ya:

4N'ihi na n'ihe-efu ka ọ biara, ọ bu kwa n'ọchichiri ka ọ nāla, eji kwa ọchichiri kpuchi aha-ya;

5ọzọ, ọ hughi anyanwu, ọ maghi kwa ihe ọ bula; izu-ike diri nka kari onye ahu:

6e, ọ buru na ọ di ndu nnù arọ abua na ọgu iri okpukpu abua, ma ọ hughi ezi ihe: ọ̀ bughi n'otù ebe ka ha nile nāla?

7Ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu diri ọnu-ya, ma otú ọ di, ọchichọ nkpuru-obi adighi-eju eju.

8N'ihi na gini ka onye mara ihe nwebigara ókè kari onye-nzuzu? ma-ọbu gini ka onye ewedara n'ala nwere, bú onye mara ijeghari n'iru ndi di ndu?

9Ọ di nma, bú ihe-ọhuhu nke anya abua, kari njeghari nke nkpuru-obi: nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

10Ihe nke diworo, ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka akpọrọ aha-ya, amawo kwa na nke ahu bu madu: ọ pughi kwa iluso onye ka ya ike ọ̀gù.

11Ebe ọtutu okwu di nke nēme ka ihe-efu ba uba, gini ka madu nwebigara ókè?

12N'ihi na ònye mara ihe diri madu nma na ndu-ya, ọnu-ọgugu ubọchi ndu efu ya nke ọ nēme dika onyinyo? n'ihi na ònye gēgosi madu ihe gādi n'okpuru anyanwu mb͕e ọ gasiri?

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help