ABÙ ỌMA 28 - Bible Lgbo

Abú Ọma nke Devid.

1Gi, Jehova, ka m'nākpọku;

Oké nkumem, echila nti n'ebe m'nọ:

Ka I we ghara ib͕am nkiti,

M'we yie ndi nārida n'olùlù.

2Nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi,

Mb͕e m'chiliri akam abua n'ebe ime-ime-ulo nke ebe nsọ Gi di.

3Adọkpurulam tiyere ndi nēmebi iwu,

Tiye-kwa-ra ndi nālu ajọ ihe;

Ndi nāgwa madu-ibe-ha okwu udo,

Ma ihe ọjọ di n'obi-ha.

4Nye ha dika ọlu-ha si di, na dika ijọ-njọ nke nmeso nile ha si di:

Nye ha dika aka-ha si eme;

Nyeghachi ha ihe ha mere.

5N'ihi na ha adighi-aghọta ọlu nile nke Jehova,

Na n'ihi na ha adighi-aghọta ihe aka-Ya abua meworo,

Ọ gākwada ha, Ọ gaghi-ewulita ha elu dika ulo.

6Onye agọziri agọzi ka Jehova bu,

N'ihi na Ọ nuwo olu aririọ-amaram nile.

7Jehova bu ikem na ọtam;

Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka:

Obim we nāwuli elu n'ọṅù;

M'gēsite kwa n'abùm kele Ya.

8Jehova buru ya ike,

Ebe siri ike nke nzọputa nke onye nke Ya etere manu ka Ọ bu.

9Zọputa ndi-Gi, gozi kwa ihe-nketa-Gi:

Nāzù kwa ha dika aturu, nēku kwa ha n'aka-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help