I. NDI TESALỌNAIKA 4 - Bible Lgbo

1Ya mere nke fọduru, umu-nna-ayi, ayi nēkpere unu, nāriọ kwa unu nime Onye-nwe-ayi Jisus, ka, dika unu natara n'aka-ayi otú unu nāghaghi ijeghari na ime ihe gātọ Chineke utọ, ọbuná dika unu nējeghari, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari.

2N'ihi na unu matara iwu nile ayi nyere unu site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus.

3N'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ, ka unu ghara ikwa iko;

4ka onye ọ bula nime unu matara otú ọ gēnwe nwunye nke aka ya n'odido-nsọ na nsọpuru,

5ọ bughi n'ọchichọ ọjọ nke agu ihe ọjọ, ọbuná dika ndi mba ọzọ ndi nāmataghi Chineke;

6ka onye ọ bula ghara ighọb͕u na irib͕u nwa-nna-ya n'ihe a: n'ihi na Onye-nwe-ayi bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ bayere ihe ndia nile, dika ayi bu-kwa-ra uzọ gwa unu gwasi kwa unu ike.

7N'ihi na Chineke akpọghi ayi ka ayi buru ndi nādighi ọcha, kama n'odido-nsọ.

8Ya mere onye nāju, ọ bughi madu ka ọ nāju, kama ọ bu Chineke, Onye nēnye Mọ Nsọ Ya ka Ọ ba nime unu.

9Ma ọ dighi unu nkpà ka madu degara unu akwukwọ bayere ihunanya n'ebe umu-nna-unu nọ: n'ihi na unu onwe-unu bu ndi Chineke zíworo ihurita ibe-unu n'anya;

10n'ihi na unu nēme ya n'ezie n'ebe umu-nna-ayi nile ndi bi na Masedọnia dum nọ. Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari;

11ka unu nējisi kwa ike inọdu nwayọ, na ime ihe nile nke aka unu, na iji aka-unu lu ọlu, dika ayi nyere unu iwu;

12ka unu we nējeghari dika o kwesiri unu n'ebe ha nọ, bú ndi nọ n'èzí, ka ihe ọ bula ghara kwa ikpa unu.

13Ma ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere ndi nāda n'ura ọnwu, umu-nna-ayi; ka o we ghara iwuta unu, ọbuná dika ọ nēwuta ndi fọduru, ndi nēnweghi olile-anya.

14N'ihi na asi na ayi kwere na Jisus nwuru si kwa n'ọnwu bilie, otú a ndi emere ka ha da n'ura ọnwu site n'aka Jisus, ọ bu ndia ka Chineke gēkuru ka ha so Ya bia.

15N'ihi na nka ka ayi nāgwa unu n'okwu Onye-nwe-ayi, na ayi onwe-ayi, bú ndi nọ na ndu, ndi anārapu rue ọbibia nke Onye-nwe-ayi, na ayi agaghi-eburu ndi dara n'ura onwu uzọ ma-ọli.

16N'ihi na Onye-nwe-ayi onwe-ya gēwere oké ikpọ-òkù, were olu isi-mọ-ozi, were kwa opì nke Chineke, si n'elu-igwe ridata: ndi nwuru nime Kraist gēbu kwa uzọ si n'ọnwu bilie:

17mb͕e ahu ayi onwe-ayi, bú ndi nọ na ndu, ndi anārapu, ayi na ha ka agēwelikọ n'igwe-oji, izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe: otú a ka ayi na Onye-nwe-ayi gānọ kwa mb͕e nile.

18Ya mere werenu okwu ndia nākasirita ibe-unu obi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help