1Job we za, si,
2Nurunu okwum nke-ọma;
Ka nka buru kwa nkasi-obi-nnu.
3Nagidenum, mu onwem gēkwu kwa okwu;
Ma mb͕e m'kwusiri okwu, i gāchì ọchì.
4Mu onwem, ọ̀ bu madu ka m'nātamuru ntamu?
Ma ọ buru na ọ di otú a, gini mere mọm nējighi arapu ibu ihe nādighi-ewe iwe ọsọsọ?
5Chenum iru, ka ibobo nwu kwa unu n'aru,
Tukwasi-kwa-nu aka n'ọnu.
6Ọ buru kwa na echetam, anam-ama jijiji,
Ima-jijiji ejidewo kwa anu-arum.
7Gini mere ndi nēmebi iwu nādi ndu,
Ghọ okenye, nābu kwa ndi di ike bu dìnkpà?
8Emewo ka nkpuru-ha so ha guzosie ike n'iru ha,
Emewo kwa ka umu nke putara n'aru-ha guzosie ike n'anya-ha.
9Ulo-ha di n'udo pua n'oké egwu,
Nkpa-n'aka Chineke adighi kwa n'aru ha.
10Oke-ehi-ya nāb͕à nne-ehi, ọ dighi-ab͕ahie;
Nne-ehi-ya nāmu nwa, ọ dighi-ekwo ime.
11Ha nēzipu umu-ha nāṅu ara dika ìgwè ewu na aturu,
Umu-ha nēte kwa egwú.
12Ha nēweli olu-ha n'egwú-otiti na ubọ-akwara,
Nāṅuri kwa ọǹu n'olu ọ̀jà.
13Ha nāla ubọchi nile ha n'iyì n'ọdi-nma,
Ma n'otù ntabi-anya ha nārida n'ala-mọ.
14Ha we si Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi;
N'ihi na ọmuma uzọ-Gi nile atọghi ayi utọ.
15Gini bu Onye Nke puru ime ihe nile, nke ayi gābu orù-Ya?
Gini ka ọ gābara ayi, ma ayi riọ Ya aririọ?
16Le, ọ bughi n'aka-ha ka ọdi-nma-ha di:
Ndum-ọdu nke ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.
17Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu?
Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha?
Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya?
18Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe,
Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori?
19Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya.
Ka Ọ kwughachi onye ahu n'onwe-ya, ka o we mara ya.
20Ka anya-ya abua hu nbibi-ya,
Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile.
21N'ihi na ìhe ulo-ya gēsi aṅa tọ ya utọ mb͕e ọ nwusiri,
Mb͕e ekepusiri ọnu-ọgugu ọnwa-ya nile n'etiti?
22Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe.
23Otù onye nānwu n'ume-ya zuru okè,
Mb͕e ọ nānọzu jū na n'udo:
24Ihe-ya nile juputara na miri-ara-ehi,
Umi ọkpukpu-ya nile edewo kwa miri.
25Onye ọzọ nānwu n'ilu nkpuru-obi,
Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe.
26Ha abua n'otù, n'elu ájá ka ha nēdinakọ,
Ikpuru nēkpuchi kwa ha.
27Le, amawom èchìchè-unu,
Na nzube nile unu ji megidem ihe-ike.
28N'ihi na unu nāsi, Òle ebe ulo onye-isi di?
Òle ebe ulo-ikwū nke ebe-obibi ndi nēmebi iwu di kwa?
29Ùnu ajughi ndi nāgabiga n'uzọ?
Ùnu amaghi kwa ihe-iriba-ama-ha?
30Na ọ bu rue ubọchi nhuju-anya ka anēb͕ochi onye ọjọ?
Na ọ bu rue ubọchi ọnuma ka anēdupu ha?
31Ònye gēgosi uzọ-ya n'iru ya?
Ihe ahu kwa nke o mere, ònye gākwughachi ya?
32Ma agēburu onye ahu rue ílì,
Ọ gēche kwa nche n'elu obo-ya.
33Ọkpurukpu-àjà nke ndagwurugwu gātọ ya utọ,
Madu nile gādọrọ onwe-ha iso ya n'azu,
Dika ndi anāpughi igu ọnu buru ya uzọ.
34Ùnu si kwa aṅa kasiem obi n'efu, Ebe nání nmekpu fọduru nime nzaghachi nile unu?
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.