ILU 31 - Bible Lgbo

1Okwu Lemuel, bú eze; ibu eboro ya nke nne-ya ji dọ ya aka na nti.

2Gini, nwam? gini kwa, nwa nke afọm?

Gini kwa, nwa nke nkwa nile m'kwere?

3Enyela ndinyom ike-gi,

Enye-kwa-la ihe nēbibi ndi-eze uzọ-gi nile.

4Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine;

Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di?

5Ka ha we ghara iṅu, we chezọ ukpuru atọrọ,

We b͕anwe ikpé nke ndi nile ewedara n'ala.

6Nyenu onye nāla n'iyì ihe-ọṅuṅu nābà n'anya,

Nye-kwa-nu ndi nkpuru-obi-ha di ilu manya-vine:

7Ya ṅua, we chezọ ob͕eye ọ bu,

Ghara kwa icheta ọnọdu ọjọ ya ọzọ.

8Saghere onye-ob͕i ọnu-gi,

N'okwu-ikpe nke ndi nile nāla n'iyì.

9Saghe ọnu-gi, kpe ikpe n'ezi omume,

Kpeputa kwa onye ewedara n'ala na ob͕eye.

10Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọputa ya?

N'ihi na ọnu-ahia-ya kariri ruby nke-uku.

11Obi di-ya atukwasiwo ya obi,

Ọ dighi kwa ihe-nkwata nākọ nwoke ahu.

12Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ,

Ubọchi nile nke ndu-ya.

13Ọ chọwo aji-anu na flax,

We nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ.

14Ọ di ka ub͕ọ onye-ahia;

Site n'ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya.

15O nēbili kwa mb͕e abali nādi kwa,

We nye ulo-ya nri,

Nye kwa umu-ab͕ọghọ-ya òkè-ha.

16O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya:

Site n'ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine.

17O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké,

Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume.

18Ọ matawo na ihe-ahia-ya di nma:

Oriọna-ya adighi-anyu n'abali.

19Aka-ya abua ka o setiworo n'osisi ikuku ogho,

Ọbu-aka-ya abua ejidesiwo kwa ozele ike.

20Ọbu-aka-ya ka ọ b͕asapuworo nye onye ewedara n'ala;

E, aka-ya abua ka o setiworo rue ob͕eye aru.

21Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe;

N'ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie.

22Ákwà-nb͕abá mara nma ka ọ kpaworo onwe-ya;

Ezi ákwà ọcha na ákwà ododo ka uwe-ya bu.

23Onye amara n'ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu,

Mb͕e ọ nānọdu n'etiti ndi-okenye ala.

24Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya;

Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia.

25Ike na ima-nma bu uwe-oyiyi-ya;

Ọ nāchì kwa ubọchi di n'iru ọchì.

26Ọnu-ya ka ọ sagheworo n'amam-ihe;

Iwu nke ebere dikwasi kwa n'ire-ya.

27Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma,

Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri.

28Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma;

Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si:

29Ọtutu umu-ndinyom emewo omume kwesiri ndinyom nējide onwe-ha nke-ọma,

Ma gi onwe-gi kachasi ha nile.

30Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu:

Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto

31Nyenu ya ihe sitere na nke aka-ya abua lutara;

Ka ọlu-ya nile to kwa ya n'ọnu-uzọ-ama nile.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help