LEVITIKỌS 5 - Bible Lgbo

1Mb͕e madu gēmehie, site n'inu olu ọb͕ub͕a-iyi, mb͕e ya onwe-ya bu onye-àmà, ma ọ bu na ọ huwo ma-ọbu na ọ mawo, ọ buru na o gosighi ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya:

2ma-ọbu mb͕e madu gēmetu ihe ọ bula ruru árú aru, ma ọ bu ozu anu-ọhia ruru árú, ma-ọbu ozu anu-ulo ruru árú, ma-ọbu ozu ihe nēnuputa enuputa nke ruru árú, ma ezonariri ya ya, ya onwe-ya ewe ru kwa árú, ikpe gāma kwa ya:

3ma-ọbu mb͕e ọ gēmetu ihe ruru árú nke madu, ọbuná ihe ọ bula nke ya ruru árú nke eji meru ya, ma ezonariri ya ya; mb͕e ya onwe-ya mara, ikpe gāma kwa ya:

4ma-ọbu mb͕e madu gāṅu iyi, nēwere eb͕ub͕ere-ọnu-ya kwu okwu efu ime ihe ọjọ, ma-ọbu ime ezi ihe, ọbuná okwu efu ọ bula madu nēkwu n'iṅu iyi, ma ezonariri ya; mb͕e ya onwe-ya mara, ikpe gāma kwa ya bayere otù nime ihe ndia:

5o gēru kwa, mb͕e ikpe mara ya bayere otù nime ihe ndia, na o gēkwuputa ihe ahu nke ọ mehieworo nmehie bayere ya:

6ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie-ya nke ọ mehieworo, bú nne nke si n'ìgwè ewu na aturu puta, nwa-aturu ma-ọbu nwa-ewu, ka ọ buru àjà-nmehie; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu.

7Ma ọ buru na aka-ya erughi ihe gēzù nwa-aturu, o gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie nke ọ mehieworo, bú nduru abua ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua; otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku.

8Ọ gāchitara ha onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gēburu uzọ weta nso nke diri àjà-nmehie, ọ gātubipu isi-ya site n'olu-ya, ma ọ gaghi-ekewa ya.

9Ọ gēfesa ufọdu nime ọbara àjà-nmehie ahu n'elu akuku ebe-ichu-àjà; ma nke fọduru nime ọbara ka agāgbasa na ntọ-ala ebe-ichu-aja: àjà-nmehie ka ọ bu.

10Ọ gēme nke-abua ka ọ buru àjà-nsure-ọku dika ikpé ahu si di: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu nke ọ mehieworo, agāb͕aghara kwa ya ya.

11Ma ọ buru na aka-ya erughi na nduru abua ma-ọbu n'umu-kpalakwu-kwu abua, ọ gēweta kwa onyinye-ya iji biaru nso, bayere nmehie nke ọ mehie-woro, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ka ọ buru àjà-nmehie; ọ gaghi-atukwasi ya manu, ọ gaghi-etiye kwa frankincense n'elu ya: n'ihi na àjà-nmehie ka ọ bu.

12Ọ gēweta-kwa-ra ya onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gēweju kwa nweju-aka-ya site na ya ibu ihe-ncheta-ya, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, n'elu àjà-ọku nke Jehova: àjà-nmehie ka ọ bu.

13Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu nke ọ mehieworo n'otù nime ihe ndia, agāb͕aghara kwa ya ya: ma nke fọduru gābu ihe onye-nchu-àjà nwere, dika onyinye-inata-iru-ọma ahu.

14Jehova we gwa Moses okwu, si,

15Mb͕e madu gēmekpu ihe-nmekpu, mehie n'amaghi-ama megide ihe nsọ nile nke Jehova; ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, bú ebulu zuru okè si n'ìgwè ewu na aturu puta, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di n'ọla-ọcha shekel, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma:

16ma ihe nke ọ mehieworo megide ihe nsọ ahu, ọ gākwughachi ya, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise n'elu ya, nye ya onye-nchu-àjà: onye-nchu-àjà gēwere ebulu àjà-ikpe-ọmuma kpuchiere ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.

17Ma ọ buru si na madu emehie, me ihe megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme; ọ bu ezie na ọ maghi, ma ikpe mara ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya.

18Ọ gēweta-kwa-ra onye-nchu-àjà ebulu zuru okè si n'ìgwè ewu na aturu puta, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie bayere ihe ọ mere n'amaghi-ama, ma ya onwe-ya amaghi ya, agāb͕aghara kwa ya ya.

19Àjà-ikpe-ọmuma ka ọ bu: ikpe mara ya n'ezie n'iru Jehova.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help