I. IHE EMERE 19 - Bible Lgbo

1O rue, mb͕e ihe a gasiri, na Nehash, bú eze umu Amon, nwuru, nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2Devid we si, M'gēmere Hanun nwa Nehash ebere, n'ihi na nna-ya merem ebere. Devid we ziga ndi-ozi ikasi ya obi bayere nna-ya. Ndi-orù Devid we ba n'ala umu Amon jekuru Hanun, ikasi ya obi.

3Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, Devid, ọ̀ nāsọpuru nna-gi n'anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa ala-ayi, na ikwatu ya, na iledo ya, ka ndi-orù-ya biakutere gi?

4Hanun we were ndi-orù Devid, kọpu ha afu-ọnu, bipu kwa uwe-nwuda-ha n'etiti, rue otule-ha, we zilaga ha.

5Ewe je gosi Devid ihe bayere ndikom ahu. O we ziga izute ha; n'ihi na ihere nēme ndikom ahu nke-uku. Eze we si, Nọdunu na Jeriko rue mb͕e afu-ọnu-unu tolitere, mb͕e ahu ka unu gālata.

6Umu Amon we hu na ha emewo onwe-ha ka ha nēsi Devid ísì ọjọ, Hanun na umu Amon we ziga nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri igotara onwe-ha ub͕ọ-ala na ndi-inyinya site na Mesọpọtemia, site kwa na Siria Meaka, site kwa na Zoba.

7Ha we gotara onwe-ha orú nnù ub͕ọ-ala uzọ anọ, na eze Meaka na ndi-ya; ha we bia ma ulo-ikwū-ha n'iru Medeba. Umu Amon si-kwa-ra n'obodo nile ha chikọta onwe-ha, bia ibu agha.

8Devid we nu ya, ziga Joab, na usu-ndi-agha nile, bú ndi-dike.

9Umu Amon we puta, do agha n'usoro n'ọnu-uzọ obodo: ma ndi-eze ndi biara nọrọ onwe-ha n'ọhia.

10Joab we hu na iru agha ahu di megide ya iru na azu, o we rọputa ufọdu n'etiti ndi Israel nile arọputara arọputa, do ha n'usoro izute Siria.

11O tiye ndi Israel fọduru n'aka Abishai, bú nwa-nne-ya, ha we do onwe-ha n'usoro izute umu Amon.

12Ọ si, Ọ buru na Siria akariam ike, i gābu-kwa-ram onye-nzọputa: ma ọ buru na umu Amon akaria gi ike, m'gāzọputa kwa gi.

13Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n'ihi ndi-ayi, na n'ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n'anya-Ya.

14Joab na ndi soro ya we biarue nso n'iru ndi Siria ibu agha; ha we b͕alaga n'iru ya.

15Umu Amon we hu na Siria ab͕alagawo, ha onwe-ha we b͕alaga kwa n'iru Abishai nwa-nne-ya, ba n'obodo. Joab we biarue Jerusalem.

16Siria we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we ziga ndi-ozi, me ka Siria ndi nọ n'ofè Osimiri puta, Shofak onye-isi usu-ndi-agha Hedareza je-kwa-ra n'iru ha.

17Ewe gosi Devid; o we chikọta Israel nile, gabiga Jọdan, biakute ha, do agha n'usoro megide ha. Devid we do ndi-ya n'usoro izute Siria, ha we buso ya agha.

18Siria we b͕alaga n'iru Israel; Devid we b͕ue n'etiti ndi Siria ndikom nke nnù ub͕ọ-ala iri-na-asa na ọgu iri, na orú nnù ndikom uzọ ise, bú ndi ji ukwu eje, o me-kwa-ra ka Shofak, bú onye-isi usu-ndi-agha-ha, nwua.

19Ndi-orù Hedareza we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we me ka ha onwe-ha na Devid di n'udo, we fè ya òfùfè: Siria ekweghi kwa izọputa umu Amon ọzọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help