ABÙ ỌMA 2 - Bible Lgbo

1N'ìhi gini ka mba nile meworo oké nkpọtu?

N'ìhi gini ka ndi nile di n'uwa nātughari ihe-efu n'uche?

2Ndi-eze nke uwa nēguzo onwe-ha,

Ndi-isi nāb͕akọta kwa ìzù,

Imegide Jehova, na imegide onye-Ya etere manu, si,

3Ka ayi tijie ab͕u nile ha,

Tufue udọ̀ nile ha n'aru ayi.

4Onye nānọdu n'elu-igwe nāchi ọchì:

Onye-nwe-ayi nākwa ha emò.

5Mb͕e ahu Ọ gāgwa ha okwu n'iwe-Ya,

Ọ bu kwa n'iwe-Ya di ọku ka Ọ gēme ka ha ma jijiji:

6Ma Mu onwem emewo ka ezem guzosie ike

N'elu Zaion, bú ugwu nsọm.

7M'gākọ akukọ bayere ukpuru:

Jeohva sirim, Ọkparam ka gi onwe-gi bu;

Mu onwem amuwo gi ta.

8Riọm, na agamenye gi mba nile ka ha buru ihe-nketa-gi,

Na nsọtu uwa ka ha buru ihe-onwunwe-gi.

9I gēji nkpa-n'aka ígwè tijisi ha;

Dika ihe ọkpu-ite kpuru ka agātupia ha.

10Ma ub͕u a, ndi-eze, nwenu uche:

Ka adọ unu aka na nti, ndi-ikpe nke uwa.

11Werenu egwu fè Jehova òfùfè,

Were-kwa-nu ọma-jijiji tegharia egwú ọṅù.

12Sutunu onye arọputaworo ọnu, ka ọ ghara iwe iwe, unu we la n'iyì n'uzo,

N'ihi na iwe-ya gēre ọku na mb͕e ntà.

Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ha bu, bú ndi nile nāb͕abà nime ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help