1Israel we biri na Shitim, ndi Israel we malite isoro umu-ndinyom Moab nākwa iko:
2ndinyom ahu we kpọ ndi Israel ibia n'àjà chi nile ha; ndi Israel we rie ihe, kpọ isi ala nye chi nile ha.
3Israel we kekọta onwe-ya n'aru Beal-peoa: iwe Jehova we di ọku megide Israel.
4Jehova we si Moses, Chiri ndi-isi nile nke ndim, kpọgidere ha Jehova n'iru anyanwu, ka idi-ọku nke iwe Jehova we si n'aru Israel laghachi.
5Moses we si ndi-ikpé Israel, B͕uenu, onye ọ bula ya b͕ue ndikom-ya ndi nēkekọta onwe-ha n'aru Beal-peoa.
6Ma, le, otù nwoke nime umu Israel biara, weta nso umu-nne-ya otù nwayi Midian n'anya Moses, na n'anya nzukọ nile nke umu Israel, mb͕e ha onwe ha nākwa ákwá n'ọnu-uzọ ulo-kwū nzute.
7Finehas, nwa-nwoke Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, we hu ya, o we si n'etiti nzukọ Israel bilie, were ube n'aka-ya,
8soro nwoke Israel ahu ba nime ulo-ndina-ya, mapue ha abua, bú nwoke Israel ahu, na nwayi ahu rue ime-afọ-ya. Ewe b͕ochie ihe otiti ahu n'aru umu Israel.
9Ma ndi nwuru n'ihe-otiti ahu di orú nnù uzọ atọ.
10Jehova we gwa Moses okwu, si,
11Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, emewo ka ọnumam si n'aru umu Israel laghachi, n'iwere ekworom kwo ekworo n'etiti ha, M'we ghara ime ka umu Israel gwusia n'ekworom.
12N'ihi ya si ya, Le, anamenye ya ọb͕ub͕a-ndum nke udo:
13ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya, ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà ebighi-ebi; n'ihi na o kworo ekworo bayere Chineke-ya, kpuchi-kwa-ra umu Israel nmehie-ha.
14Ma aha nwoke Israel ahu nke etib͕uru etib͕u, onye etib͕uru ya na nwayi Midian, bu Zimri, nwa Salu, bú onye-isi nke otú ulo nna nke ndi Simeon.
15Aha nwayi Midian ahu nke etib͕uru etib͕u bu Kọzbi, nwa Zua; onye-isi mba nke otù ulo nna na Midian ka ọ bu.
16Jehova we gwa Moses okwu, si,
17Kpab͕ue ndi Midian, tib͕u kwa ha:
18n'ihi na ha nākpab͕u unu n'aghughọ nile ha, nke ha ji ghọb͕u unu n'okwu Peoa, na n'okwu kọzbi, bú nwa-nwayi onye-isi Midian, nwa-nne-ha nwayi, nke etib͕uru n'ubọchi ihe-otiti ahu n'okwu Peoa.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.