ABÙ ỌMA 123 - Bible Lgbo

Abù Nrigo.

1Gi ka m'gēweli anyam abua le,

Gi Onye nānọdu ala n'elu-igwe.

2Le, dika anya ndi-orù si elekwasi aka ndi-nwe-ha,

Dika anya abua nke nwayi nēje ozi si elekwasi aka nwayi nwere ike n'aru ya;

Otú a ka anya-ayi nēlekwasi Jehova, bú Chineke-ayi,

Rue mb͕e Ọ gēmere ayi amara.

3Mere ayi amara, Jehova, mere ayi amara:

N'ihi na nleda ejuwo ayi afọ ri nne.

4Afọ ejuwo nkpuru-obi-ayi ri nne

N'ichì-ọchì nke ndi nọ jū,

Na nleda nke ndi-npako.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help