NDI ROM 3 - Bible Lgbo

1Gini kwa ka onye-Ju nwebigara ókè? ma-ọbu ùrù gini ka ibì-úgwù bara?

2Ọ bara urù ri nne n'uzọ nile: mbu, na ewere okwu si n'ọnu Chineke puta nye ha n'aka na ntukwasi-obi.

3N'ihi na asi na ufọdu ekweghi, gini kwa? èkweghi-ekwe-ha gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi nke Chineke ghara idi irè?

4Chineke ekwela: kama ka ọ puta ihè na Chineke bu Onye ezi-okwu, ma madu nile n'otù n'otù bu ndi-ugha; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,

Ka ewe gua Gi n'onye ezi omume n'okwu-Gi nile,

Ka I we kpeb͕u kwa mb͕e anēkpe Gi ikpé.

5Ma ọ buru na ajọ omume-ayi eme ka ezi omume Chineke puta ìhè, gini ka ayi gēkwu? Chineke, Onye nēme ka iwe-Ya dakwasi ayi, Ọ̀ bu onye ajọ omume? (Anamekwu dika madu.)

6Chineke ekwela: n'ihi na Chineke gēsi kwa aṅa kpe uwa ikpé?

7Ma ọ buru na ezi-okwu nke Chineke babigara uba ókè n'iwetara Ya ebube site n'okwu-ugha nkem, gini mere anēkpe kwa mu onwem ikpé ọzọ dika onye-nmehie?

8gini me-kwa-ra ayi asighi, Ka ayi me ihe ọjọ, ka ezi ihe we puta? (dika anēkwulu ayi, dika ufọdu nēkwu kwa na ayi nāsi), ndi ikpé-ha ziri ezi.

9Gini kwa? àyi ka ha nma? É-è, ayi akaghi ha nma ma-ọli: n'ihi na ayi buru uzọ bo ndi-Ju bo kwa ndi-Grik ebubo, na ha nile nọ n'okpuru nmehie;

10dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,

Ọ dighi onye bu onye ezi omume, ọ dighi otù onye ma-ọli;

11Ọ dighi onye nāghọta,

Ọ dighi onye nāchọ Chineke;

12Ha nile ewezugawo onwe-ha, ha nile abaghi n'ihe n'otù;

Ọ dighi onye nēme ihe ọma, ọ dighi ọbuná otù onye:

13Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu;

Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ:

Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha:

14Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu:

15Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara;

16Nbibi na ihuju-anya di n'uzọ nile ha;

17Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa:

18Egwù Chineke adighi n'anya-ha.

19Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ:

20n'ihi na site n'ọlu nile nke iwu ọ dighi madu ọ bula agāgu n'onye ezi omume n'iru Ya: n'ihi na ọ bu n'aka iwu ka nmazu nke nmehie sitere.

21Ma ub͕u a emewo ka ezi omume Chineke puta ìhè nke nēguzo iche n'ebe iwu di, nke iwu ahu na ndi-amuma nāb͕ara ya àmà;

22ma ọ bu ezi omume Chineke, site n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist, nke diri ndi nile kwere: n'ihi na ọ dighi ihe di iche;

23n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke;

24anēwere kwa amara-Ya nāgu ha na ndi ezi omume n'onyinye efu site na nb͕aputa ahu nke di nime Kraist Jisus:

25Onye Chineke chere n'iru ọra madu ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi, site n'okwukwe ekwere n'ọbara-Ya, igosi ezi omume-Ya, n'ihi nb͕aghara nmehie nile emehiereri n'oge gara aga, n'oge nnagide nke Chineke;

26ka O we gosi ezi omume-Ya n'oge di ub͕u a, ka m'kwuru: ka Ya onwe-ya we buru onye ezi omume, buru kwa onye nāgu onye ahu n'onye ezi omume, bú onye nọ n'okwukwe ekwere na Jisus.

27Òle ebe inya-isi-ayi di kwa? Emechibidowo ya n'èzi. Sìte n'aha iwu gini? ọ̀ bu nke ọlu? É-è: kama ọ bu site n'iwu nke okwukwe.

28Ya mere ayi guru na anāgu madu n'onye ezi omume site n'okwukwe, mb͕e ọ kālughi ọlu iwu.

29Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ bu Chineke nke nání ndi-Ju? Ọ̀ bughi kwa Chineke nke ndi mba ọzọ? E, ọ bu kwa nke ndi mba ọzọ:

30asi na ọ bu ezie na Chineke bu otù, Onye gāgu ndi obibì-úgwù na ndi ezi omume site n'okwukwe, were kwa okwukwe ahu gua ndi ebìghi-úgwù na ndi ezi omume.

31Àyi nēsite kwa n'okwukwe-ayi me ka iwu ghara idi irè? Chineke ekwela: kama ayi nēme ka iwu guzo.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help