III. JỌN 1 - Bible Lgbo

1Okenye nēdegara Gaiọs akwukwọ, bú onye ahuru n'anya, onye mu onwem nāhu n'anya n'ezi-okwu.

2Onye m'huru n'anya, anamekpere Chineke ka ihe nile nāgara gi nke-ọma, ka i nwe kwa ezi ndu, dika ọ nāgara nkpuru-obi-gi nke-ọma.

3N'ihi na aṅuririm ọṅu nke-uku, mb͕e umu-nna-ayi ufọdu biara we b͕a àmà ezi-okwu-gi, dika gi onwe-gi nējeghari n'ezi-okwu.

4Enweghm ọṅù nke ka ihe ndia uku, bú inu ka umu nke akam nējeghari n'ezi-okwu ahu.

5Onye m'huru n'anya, i nēme ihe kwesiri ntukwasi-obi n'ọlu ọ bula i luru n'ebe ndi bu umu-nna-ayi, ndi bu kwa ndi-ọbìa, nọ;

6ndi b͕ara àmà ihu-n'anya-gi n'iru nzukọ Kraist: ndi i gēme nke-ọma idupu ha n'ije-ha dika o kwesiri imere Chineke:

7n'ihi na ọ bu n'ihi Aha ahu ka ha puru, nānaraghi ihe ọ bula n'aka ndi mba ọzọ.

8Ya mere ayi onwe-ayi ji ugwọ ikpọbata madu di otú a, ka ayi we buru kwa ndi soro ezi-okwu ahu nālukọ ọlu.

9Edegaram nzukọ-unu ihe n'akwukwọ: ma Diọtrefis, onye ọ nātọ utọ ibu onye-isi n'etiti ha, anaraghi ayi nke-ọma.

10N'ihi nka, ọ buru na abiam, m'gēme ka echeta ọlu-ya nile nke ọ nālu, n'iwere ajọ okwu nēkwugide ayi ihe-nzuzu: afọ ejughi kwa ya n'ihe ahu, ma ya onwe-ya adighi-anara umu-nna-ayi nke-ọma, ọ nēb͕ochi kwa ndi nēzube inara ha, ọ nāchupu kwa ha na nzukọ Kraist.

11Onye m'huru n'anya, eṅomila ihe ọjọ, kama nēṅomi ezi ihe. Onye nēme ezi ihe bu onye siri na Chineke puta: onye nēme ihe ọjọ ahughi Chineke mb͕e ọ bula.

12Madu nile, ha na ezi-okwu onwe-ya, ab͕aworo Dimitriọs àmà: e, ayi onwe-ya nāb͕a kwa àmà; i mata-kwa-ra na àmà-ayi bu ezie.

13Enwerem ọtutu ihe idegara gi n'akwukwọ, ma achọghm iwere ink na pen degara gi:

14ma anamele anya ihu gi ngwa ngwa, ayi gēwere kwa ọnu kwurita okwu.

15Ka udo diri gi. Ndi-eyì-ayi nēkele gi. Nēkele ndi-eyì-ayi n'aha n'aha.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help