1Ntọ-ala-Ya di n'ugwu nsọ nile.
2Jehova nāhu ọnu-uzọ-ama nile nke Zaion
Kari ebe-obibi nile nke Jekob.
3Ihe di iche iche nke di nsọpuru ka anēkwu bayere gi,
Obodo Chineke. Selah
4M'gēhota Rehab na Babilon, na ha di n'etiti ndi maram:
Le Filistia na Taia, ha na Etiopia;
Nka ka amuru n'ebe ahu.
5Ọ bu kwa Zaion ka agēkwu okwu bayere ya, si, Onye na onye ọ bula ka amuru nime ya;
Ọzọ, Ya onwe-ya, bú Onye kachasi ihe nile elu, gēme ka o guzosie ike.
6Jehova gāgu, mb͕e O ji de ndi nile di iche iche n'akwukwọ, si,
Nka ka amuru n'ebe ahu. Selah
7Ma ndi nābù abù ma ndi nēte egwú, ha nile gāsi,
Isi-iyim nile di na Gi.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.