AISAIA 33 - Bible Lgbo

1Ahuhu gādiri gi onye nāpunara madu ihe, ma gi onwe-gi bu onye anāpunaraghi ihe; onye nāghọb͕u kwa aghọb͕u, ma ha aghọb͕ughi gi! mb͕e i napubìri madu ihe, agāpunara gi ihe; mb͕e i ghọb͕ubìri, ha gāghọb͕u gi.

2Jehova, mere ayi amara; Gi ka ayi leworo anya: buru ogwe-aka-ha kwa-ututu, buru kwa nzọputa-ayi na mb͕e ahuhu.

3Site n'olu ùzù ka ndi di iche iche b͕alagaworo; site na nbuli-Gi ka mba nile b͕asaworo.

4Agāchikọta kwa ihe-unu akwatara n'agha dika nchikọta nke ọbubu: dika nb͕aghari nke igurube, otú a ka ọ nāb͕aghari n'elu ya.

5Jehova di elu; n'ihi na O bi n'elu: O mejuwo Zaion n'ikpe ziri ezi na ezi omume.

6Ikwesi-ntukwasi-obi gādi kwa na mb͕e-gi nile, iba-uba nke nzọputa na amam-ihe na ihe-ọmuma: egwu Jehova, nke ahu bu àkù-ya.

7Le, dìnkpà-ha nile nēti nkpu n'èzì: ndi-ozi udo nākwakpọ anya.

8Uzọ nile atuliri atuli tọb͕ọrọ n'efu, onye nāgabiga n'uzọ akwusiwo: o mebiwo ọb͕ub͕a-ndu, ju obodo nile, ọ gughi madu n'ihe.

9Ala nēru újú, talata: Lebanon nwere iru-ihere, ọ janwuwo ajanwu: Sheron di ka ala ihe nādighi; Beshan na Kamel nārurupu kwa akwukwọ-ha.

10Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova nāsi; ub͕u a ka M'gēme onwem ka M'di elu; ub͕u a ka agēbulim.

11Unu gātu ime ahihia kpọrọ nku, unu gāmu ahihia-ọka: nku-ume-unu bu ọku nke gērichapu unu.

12Ndi di iche iche gādi kwa ka lime akpọrọ ọku: dika ogwu eb͕uturu eb͕utu, nke anēsure n'ọku.

13Unu ndi nọ n'ebe di anya, nurunu ihe M'meworo; unu kwa ndi nọ nso, maranu idi-ikem.

14Ndi-nmehie nātu oké egwu nime Zaion; ọma-jijiji ejidewo ndi emeruru emeru. Ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nērichapu erichapu di? ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nēre ere ebighi-ebi di?

15Ọ bu onye nējeghari n'ezi omume nile, nke nēkwu kwa okwu nile ziri ezi; nke nāju urù nmeb͕u nile, nke nētichapu ọbu-aka-ya abua n'ijide ihe-iri-ngo, nke nākwuchi nti-ya abua ka ọ ghara inu okwu bayere iwusi ọbara, nke nātachi kwa anya-ya abua ka ọ ghara ilekwasi ihe ọjọ anya;

16onye ahu gēbi n'ebe di elu: ebe ewusiri ike nke nkume di elu ka ulo-elu-ya gābu: anēnye ya nri-ya; miri-ya kwesiri ntukwasi-obi.

17Eze n'ima-nma-ya ka anya-gi abua gāhu: ha gāhu ala nke ebe nile ọ sọturu di anya.

18Obi-gi gēchè èchìchè oké ujọ ahu: òle ebe onye nāgu ọnu nọ? òle ebe onye nātù ego-utu nọ? òle ebe onye nāgu ulo-elu ọnu nọ?

19Ndi ahu nke nwere anya-ike, i gaghi-ahu ya, bú ndi asusu-ya miri emi kari ọnunu; nke ire-ya nāsu nsu nādighi nghọta.

20Lekwasi Zaion anya, bú obodo nke mb͕e nile ayi akara àkà: anya-gi abua gāhu Jerusalem na ọ bu ulo-obibi di jū, ulo-ikwū nke anāgaghi-ebupu ebupu, nke anāgaghi-eropu ǹtú-ya ọ bula rue ebighi-ebi, nke anāgaghi-adọbi kwa udọ̀-ya ọ bula.

21Kama n'ebe ahu ka Onye di ebube, bú Jehova, gānọduru ayi, dika ebe ọtutu osimiri na uzọ di iche iche miri si erù nke sara mbara n'aka abua; ub͕ọ-umara agaghi-aga nime ya, ub͕ọ di ebube agaghi-agabiga kwa n'elu ya.

22N'ihi na Jehova bu onye-ikpe-ayi, Jehova bu onye nēnye ayi iwu, Jehova bu eze-ayi; Ya onwe-ya gāzoputa ayi.

23Atọsawo udọ̀-gi nile; ha adighi-ejisi ukwu akpu-ha ike, ha ab͕asaghi ọkọlọtọ-ha: mb͕e ahu ekesara ihe alutara n'agha, bú ihe akwatara n'uba; ndi-ngwurọ lutara ihe-nluta-n'agha.

24Onye-obibi-ya agaghi-asi, Anamaria ọria: agēbupu ajọ omume nke ndi bi nime ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help