LEVITIKỌS 19 - Bible Lgbo

1Jehova we gwa Moses okwu, si,

2Gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si ha, Nsọ ka unu gādi: n'ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, Chineke-unu, di.

3Unu gātu egwu, onye ọ bula ọ tua egwu nne-ya na nna-ya, unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem nile: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

4Unu echela ihe-efu ọ bula iru, unu eme-kwa-lara onwe-unu chi ọ bula awuru awu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

5Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà nké àjà-udo, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ.

6N'ubọchi unu churu ya ka agēri ya, ya na echi-ya: ma nke fọduru rue ubọchi nke-atọ, n'ọku ka agēsure ya.

7Ma ọ buru na erie ya ma-ọli n'ubọchi nke-atọ, ihe-árú ka ọ bu; ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ:

8ma onye nēri ya gēbu ajọ omume-ya, n'ihi na ihe nsọ nke Jehova ka o meworo ka ọ ghara idi nsọ: aga ebipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti umu-nna-ya.

9Ma mb͕e unu nēwe ihe-ubi nke ala-unu, ewesila ihe di n'akuku ubi-gi, achikọta-kwa-la ihe-nchikọta nke owuwe-ihe-ubi-gi fọduru

10Atutukọ-kwa-la nkpuru ubi-vine-gi fọduru, achikota-kwa-la nkpuru dara ada n'ubi-vine-gi; ob͕eye na ọbìa ka i gārapuru ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

11Unu ezula ori; unu aghọ-kwa-la aghughọ, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha, otù n'ebe ibe-ya nọ.

12Unu ewe-kwa-la aham ṅu iyi n'okwu-ugha, we me ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.

13Emeb͕ula madu-ibe-gi, anapu-kwa-la ya ihe n'ike: ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu agaghi-adigide n'aka-gi ogologo abali nile rue ututu.

14Akọchala onye nti chiri, etiye-kwa-la ihe-isu-ngọngọ n'iru onye-ìsì, ma tua egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova.

15Unu emela ajọ omume n'ikpé: ahụla onye nēnweghi ike ikpemara iru ọma, asọpuru-kwa-la iru nke onye uku: n'ezi omume ka i gēkpe madu-ibe-gi ikpe.

16Ejegharila n'etiti umu-nna-gi dika onye nāb͕a àmà ọjọ: eguzola imegide ọbara madu-ibe-gi: Mu onwem bu Jehova.

17Akpọla nwa-nne-gi asi n'obi-gi: i ghaghi ibara madu-ibe-gi nba, ghara ibu nmehie bayere ya.

18Abọla ọ́bọ̀, edebe-kwa-la iwe megide umu ndi-gi, ma hu madu-ibe-gi n'anya dika onwe-gi: Mu onwem bu Jehova.

19Unu gēdebe ukpurum nile. Emela ka anu-ulo-gi di iche iche nāb͕a onwe-ha: aghala uzọ nkpuru abua n'ubi-gi: uwe nke eji uzọ ihe abua kpakọta agaghi-abia n'aru-gi.

20Ma mb͕e nwoke soro nwayi dina ka ọ ra aru n'aru-ya, ma nwayi ahu bu nwayi nēje ozi, nke nwoke kwere ilu, nke anāb͕aputaghi ma-ọli, nke anēmeghi kwa ka ọ nwere onwe-ya: nchọputa okwu ahu gādi; agaghi-eme ka ha nwua, n'ihi na emeghi ka nwayi ahu nwere onwe-ya.

21O gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, bú ebulu ibu àjà-ikpe-ọmuma.

22Onye-nchu-àjà gēwere kwa ebulu àjà-ikpe-ọmuma ahu kpuchiri ya nmehie-ya n'iru Jehova bayere nmehie-ya nke o mehieworo: agāb͕aghara kwa ya nmehie-ya nke o mehieworo.

23Ma mb͕e unu gābà n'ala ahu, mb͕e unu gākuwori osisi nile ọ bula ibu ihe-oriri, unu gāgu kwa nkpuru-ya n'ebighi-úgwù-ya: arọ atọ ka ọ gāburu unu ihe anēbighi úgwù; agaghi-eri ya.

24Ma n'arọ nke-anọ nkpuru-ya nile gādi nsọ, otuto anēto Jehova.

25Ma n'arọ nke-ise unu gēri nkpuru-ya, ka ọ we mikwasiri unu ihe ọmume-ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

26Unu erila ihe ọ bula ya na ọbara-ya: unu ab͕ala afa, unu eji-kwa-la igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ.

27Unu akọpula usọ isi-unu buruburu, ebibi-kwa-la usọ afu-ọnu-gi.

28Unu eb͕ula eb͕ub͕u n'anu-aru-unu n'ihi nkpuru-obi madu, unu etiye-kwa-la ihe-odide, bú eb͕ub͕u-ọku, n'aru unu: Mu onwem bu Jehova.

29Emela ka nwa-gi nwayi ghara idi nsọ, ime ka ọ ghọ nwayi nākwa iko; ka ala-gi we ghara ikwa iko, ka ala-gi we ghara kwa ijuputa na nzube ọjọ.

30Unu gēdebe ubọchi-izu-ikem nile, tu kwa egwu ebe nsọm: Mu onwem bu Jehova.

31Unu echela ndi nāju mọ ihe iru, unu eche-kwa-la ndi-dibia-afa iru; unu achọputala ha, iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

32I gēbili ọtọ n'iru onye-isi-awọ, sọpuru kwa iru okenye, tu kwa egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova.

33Mb͕e ọbìa gānoyere gi dika ọbìa n'ala-unu, unu emela ya ihe-ike.

34Dika onye amuru n'ala site n'aru unu ka ọbìa gādiri unu, bú onye nọ dika ọbìa n'etiti unu, i gāhu kwa ya n'anya dika onwe-gi; n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

35Unu emela ajọ omume-n'ikpé, ma-ọbu n'itù ihe, ma-ọbu n'isi ihe, ma-ọbu n'itù ihe di miri miri.

36Ihe-osìsì ziri ezi, na nkume isì-ihe ziri ezi na ephah ziri ezi, na hin ziri ezi, ka unu gēnwe: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt puta.

37Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, me kwa ha: Mu onwem bu Jehova.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help