ỌPUPU 23 - Bible Lgbo

1Gi eburula akukọ efu: esola onye nēmebi iwu tiye aka-gi ibu onye-àmà nke ihe-ike.

2Esola ọtutu madu n'azu ba n'ihe ọjọ di iche iche: ab͕a-kwa-la àmà bayere ise-okwu ka i we wezuga onwe-gi iso ọtutu madu n'azu iwezuga ikpé:

3asọpuru-kwa-la onye nēnweghi ike n'ise-okwu-ya.

4Mb͕e i zute ehi onye-iro-gi, ma-ọbu inyinya-ibu-ya, ka ọ nākpafu, i ghaghi ime ka ọ laghachikuru ya.

5Mb͕e i huru inyinya-ibu nke onye nākpọ gi asì ka ibu-ya nānyib͕u ya, ma i nāchọ ighara itọpuru ya ibu ahu, i ghaghi iyere ya aka itọpu ya.

6Ewezugala ikpé nke ob͕eye-gi n'ise-okwu-ya.

7I gānọpuru okwu-ugha n'ebe di anya; eb͕u-kwa-la onye ikpé nāmaghi na onye ezi omume: n'ihi na adighm-agu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume.

8Anara-kwa-la ihe-iri-ngo: n'ihi na ihe-iri-ngo nēme ka ndi nāhu uzọ kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ.

9Emeb͕u-kwa-la ọbìa: n'ihi na unu onwe-unu amawo nkpuru-obi nke ọbìa, n'ihi na ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.

10Arọ isi ka i gāgha nkpuru n'ala-gi, chikọta kwa ihe-ọmume-ya:

11ma n'arọ nke-asa i gārapu ya, me ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; ka ndi-ob͕eye nke ndi-gi we rie ihe: anu-ọhia gēri kwa ihe ha rifọrọ. Otú a ka i gēme kwa ubi-vine-gi, me kwa ubi-olive-gi.

12Ubọchi isi ka i gālu ọlu-gi, ma n'ubọchi nke-asa i gākwusi n'ọlu: ka ehi-gi na inyinya-ibu-gi we zuru ike, ọzọ, ka nwa nke orù-gi nwayi na ọbìa we turu ndu.

13Ma n'ihe nile M'siworo unu lezienu anya: unu ehota-kwa-la aha chi ọ bula ọzọ, ka aghara kwa inu ya n'ọnu-gi.

14Ub͕ò atọ ka i gēmerem ememe n'arọ.

15I gēdebe ememe achicha ekoghi-eko: ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, dika M'nyere gi iwu, na mb͕e akara àkà n'ọnwa Ebib (n'ihi na ọ bu nime ya ka i siri n'Ijipt puta); ma ọ dighi onye agāhu n'irum ka ọ b͕a aka:

16i gēdebe kwa ememe nke owuwe-ihe-ubi, bú nke nkpuru mbu nke i lutara n'ọlu, nke i nāgha n'ubi: na ememe nke nchikọta-ihe, n'ọgwugwu arọ, mb͕e i si n'ubi chikọta ihe nile i lutara n'ọlu.

17Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Onye-nwe-unu, bú Jehova.

18Achula ọbara nke àjàm n'elu achicha koro eko; abuba nke ememem agaghi-adigide kwa abali nile rue ututu.

19Ihe mbu nke nkpuru mbu nile nke ala-ubi-gi ka i gēwebata n'ulo nke Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya.

20Le, Mu onwem nēziga mọ-ozi n'iru gi, idebe gi n'uzọ, na ime ka i bata n'ebe ahu M'doziworo.

21Lezie anya n'iru ya, ge kwa nti n'olu-ya; enupula isi n'okpuru ya: n'ihi na ọ gaghi-ab͕aghara njehie-unu; n'ihi na aham di nime ya.

22N'ihi na, ma ọ buru na i ge nti n'olu-ya n'ezie, we me ihe nile nke M'nēkwu, M'gābu-kwa-ra ndi-iro-gi onye-iro, kpab͕u kwa ndi nākpab͕u gi.

23N'ihi na mọ-ozim ganēje n'iru gi, me ka i bakute ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi-Haivait, na ndi Jebus: M'gēzopu kwa ha n'uwa.

24Akpọla isi ala nye chi nile ha, efè-kwa-la ha, eme-kwa-la dika omume nile ha si di: kama i gākwadasi ha, tipiasi kwa ogidi nile ha.

25Ma unu gēfè Jehova, bú Chineke-unu, Ọ gāgọzi kwa nri-gi na miri-gi; M'gēwe-zuga kwa ọria n'etiti gi.

26Ọ gaghi-adi nwayi nēmebi ime ma-ọbu nwayi-àgà n'ala-gi: M'gēmezu ọnu-ọgugu ubọchi-gi.

27Oké ujọm ka M'gēziga n'iru gi, chusa ha, bú ndi ahu nile i gābakute ha, M'gēnye kwa gi olu ndi-iro-gi nile.

28M'gēziga kwa ebu n'iru gi, ha gāchupu ndi-Haivait, na ndi Kenean, na ndi Het, n'iru gi.

29M'gaghi-achupu ha n'iru gi n'otù arọ; ka ala we ghara ighọ ihe tọb͕ọrọ n'efu, anu-ọhia ewe ba uba megide gi.

30Nwantī nwantī ka M'gāchupu ha n'iru gi, rue mb͕e i gāmu ọmùmù, we keta ala ahu.

31M'gētiye kwa ókè-ala-gi site n'Oké Osimiri Uhie we rue oké osimiri ndi Filistia, site kwa n'ọzara rue Osimiri Yufretis: n'ihi na M'gēwere ndi bi n'ala ahu nye n'aka-unu; i gāchupu kwa ha n'iru gi.

32Gi na ha ab͕ala ndu, gi na chi-ha ab͕a-kwa-la ndu.

33Ha agaghi-ebi n'ala-gi, ka ha we ghara ime ka i mehie megidem: n'ihi na ọ buru na i fè chi-ha, ọ ghaghi iburu gi ọnyà.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help