NKPUGHE 10 - Bible Lgbo

1M'we hu mọ-ozi ọzọ di ike, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, nke eb͕okwasiworo ya igwe-oji dika uwe; eke-na-ogwurugwu ahu di kwa n'isi-ya, iru-ya di kwa ka anyanwu, ukwu-ya abua di kwa ka ide ọku;

2ọ nējide kwa nwa akwukwọ ntà n'aka-ya, nke asagheworo: o we tukwasi ukwu aka-nri ya n'elu oké osimiri tukwasi kwa ukwu aka-ekpe ya n'elu ala;

3o we were oké olu tie nkpu, dika ọdum nāb͕ọ uja: mb͕e o tiri nkpu, éb͕è-elu-igwe asa ahu we kwue olu-ha.

4Ma mb͕e éb͕è-elu-igwe asa ahu kwuru okwu, agajem ide akwukwọ: m'we nu olu si n'elu-igwe da, si Kà ihe éb͕è-elu igwe asa ahu kwuru akàrà, ede-kwa-la ha n'akwukwọ.

5Mọ-ozi ahu, nke m'huru ka ọ nēguzo n'elu oké osimiri na n'elu ala, we welie aka-nri-ya zó n'elu-igwe,

6we were Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, bú Onye kère elu-igwe na ihe nile di ya nime, na uwa na ihe nile di ya nime, na oké osimiri na ihe nile di ya nime, ṅu iyi na oge agaghi-adi kwa ọzọ:

7ma n'ubọchi nke olu mọ-ozi nke-asa ahu, mb͕e ọ gaje ifù opì, agēme kwa ka ihe-omimi nke Chineke zu okè, dika O zìri ozi ọma nye ndi-orù-Ya, bú ndi amuma-Ya.

8Olu ahu nke m'nuru ka ọ nēsi n'elu-igwe da, anu-kwa-ram ya ọzọ ka ọ nākpayerem uka, si, Je, nara akwukwọ ahu nke asagheworo, bú nke di n'aka mọ-ozi ahu onye nēguzo n'elu oké osimiri na n'elu ala.

9M'we jekuru mọ-ozi ahu, si ya ka o nyem nwa akwukwọ ntà ahu. O we sim, Nara ya, ripia kwa ya; ọ gēme kwa ka afọ-gi lue ilu, ma n'ọnu-gi ọ gātọ utọ dika manu-aṅu.

10M'we nara nwa akwukwọ ntà ahu n'aka mọ-ozi ahu, we ripia ya; o we tọ utọ n'ọnum dika manu-aṅu; mb͕e m'ripiasiri ya, ewe me ka afọm lue ilu.

11Ha nāsikwam, I ghaghi ibu amumá ọzọ bayere ọtutu ndi na ọtutu mba na ọtutu asūsū na ọtutu eze.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help