ZEKARAIA 13 - Bible Lgbo

1N'ubọchi ahu isi-iyi gādi nke ghere oghe nye ulo Devid, nye kwa ndi bi na Jerusalem, bayere nmehie baye-kwa-ra ọrurú.

2Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M'gēbipu aha nile nke arusi nile n'ala nka, agaghi-echeta kwa ha ọzọ: ọzọ kwa, M'gēme ka ndi-amuma na mọ nke iru-árú si n'ala nka gabiga.

3Ọ gēru kwa, mb͕e onye ọ bula gēbu kwa amuma ọzọ, na nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāsi ya, I gaghi-adi ndu; n'ihi na okwu-ugha ka i kwuworo n'aha Jehova: nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāmapú ya mb͕e o nēbu amuma.

4Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ihere gēme ndi-amuma, onye ọ bula n'ọhù-ya, mb͕e o nēbu amuma; ha agaghi-eyiri kwa uwe-nwuda nke aji-anu ka ha we ghọ aghughọ:

5ma ọ gāsi, Ọ dighi onye-amuma m'bu, onye-ọlu-ubi ka m'bu; n'ihi na madu mere ka ab͕atam site na mb͕e m'di na nwata.

6Agāsi kwa ya, Gini bu ntiputa-ọnyá ndia n'etiti aka-gi abua? Ọ gāsi kwa, Ha bu ọnyá etiputaram n'ulo ndi nāhum n'anya.

7Teta, gi mma-agha, imegide Onye-ọzùzù-aturum, na imegide nwoke ahu nke bu ibem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta): tib͕ue Onye-ọzùzù-aturu ahu, agāb͕asa kwa ìgwè ewu na aturu; M'gēchighari kwa akam imegide ndi ntà.

8Ọ gēru kwa, n'ala nka nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na uzọ abua nime ya ka agēbipu, ha kubìe ume; ma uzọ nke-atọ gāfọdu nime ya.

9M'gēme kwa ka uzọ nke-atọ ba n'ọku, M'gānucha kwa ha dika esi anucha ọla-ọcha, nwa ha dika esi anwa ọla-edo: ndi ahu gākpọku aham, Mu onwem gāza kwa ha: M'gāsi, Ndi nkem ka ọ bu; ndi ahu gāsi kwa, Jehova bu Chinekem.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help