II. SAMUEL 23 - Bible Lgbo

1Ma ndi a bu okwu ikpe-azu nke Devid.

Ihe nke si n'ọnu Devid nwa Jesi puta,

Na ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, bú onye emere ka o bilie,

Bayere onye nke Chineke Jekob etere manu,

Na onye nwere olu di utọ n'ibù abù ọma Israel:

2Mọ nke Jehova kwuru site n'ọnum,

Okwu-Ya di kwa n'irem.

3Chineke Israel siri,

Mu ka Oké Nkume Israel gwara okwu:

Onye nāchi madu bu onye ezi omume,

Ọ nāchi n'egwu Chineke

4Ọ di kwa ka ìhè ututu, mb͕e anyanwu nāwa,

Bú ututu igwe-oji nādighi;

Mb͕e ahihia ndu nēpuputa n'ala,

Site n'ọmumu-anyanwu, site na miri-ozuzo.

5N'ihi na ọ bughi otú a ka ulom di n'ebe Chineke nọ;

N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Ọ b͕aworo nyem,

Bú ọb͕ub͕a-ndu edoworo n'usoro n'ihe nile, nke edebewo-kwa-ra:

N'ihi na nzọputam nile, na ihe-utọ nile,

N'ezie Ọ gaghi-eme ka o pute.

6Ma ndi jọb͕uru onwe-ha di ka ogwu anēkopu ekopu, ha nile,

N'ihi na ọ bughi aka ka eji ewere ha:

7Ma nwoke nke nēmetu ha aka

Gēnweju ígwè na osisi ube aka:

Agēwere kwa ọku suresia ha n'ọnọdu-ha.

8Ndia bu aha ndi-dike, ndi Devid nwere; Josheb-bashebet onye-Tahkemonait, onye-isi nke ndi-ọchi-agha; onye ahu bu Adino onye-Eznait: onye nēmegide nnù ndikom abua eb͕uru n'otù ub͕ò.

9Nke so ya bu Eleeza nwa Dodai nwa onye Ahoa, bú otù onye n'etiti ndi-dike atọ ahu ndi ha na Devid nọ mb͕e ha rara onwe-ha nye rue ọnwu n'etiti ndi Filistia ndi chikọtara onwe-ha n'ebe ahu ibu agha, ma ndikom Israel rigoro:

10onye ahu biliri, tib͕u ndi Filistia rue mb͕e ike gwuru aka-ya, aka-ya we rapara na mma-agha: Jehova we zọputa nzọputa uku n'ubọchi ahu; ndi Israel we laghachi soro ya n'azu nání iyipu ihe di n'aru ndi eb͕uru eb͕u.

11Nke so ya bu Shama nwa Agi onye-Hararait. Ndi Filistia we chikọta onwe-ha n'usu, ma òkè ubi di n'ebe ahu juputara na lentil; ma ndi Israel b͕apuru n'iru ndi Filistia.

12O we guzo onwe-ya n'etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia: Jehova we zọputa nzọputa uku.

13Ndikom atọ n'etiti orú ndi-isi na iri ahu we rida, biakute Devid n'owuwe-ihe-ubi rue ọb͕à Adulam; ma usu ndi Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim.

14Ma Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu.

15Devid we chọsie ike, si, Ònye gēme ka m'ṅua miri sitere n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama:

16Ndi-dike atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma o kweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova.

17Ọ si, Ya burum ihe-árú, Jehova, ime ihe a: #m'gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n'aka-ha nēje? o kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere.

18Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, nwa Zeruaia, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu. Onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu.

19Àdighi-asọpuru ya kari ndikom atọ ahu? o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu.

20Benaia kwa, nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n'ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n'etiti olùlù n'ubọchi snow nēzò.

21Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, bú nwoke mara nma ile anya: ube di kwa n'aka onye Ijipt ahu; ma o ji nkpa-n'aka ridakuru ya, napu ube ahu n'aka onye Ijipt n'ike, were ube-ya b͕ue ya.

22Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n'etiti ndi-dike atọ ahu.

23Anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. Devid we do ya ibà n'etiti ndi nānu okwu-ya.

24Asahel nwa-nne Joab bu otù onye n'etiti orú ndikom na iri ahu; Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem;

25Shama onye Harod, Elika onye Harod;

26Hilez onye-Paltait, Ira nwa Ikesh onye Tekoa;

27Abieza onye Anatot, Mebunai onye Husha;

28Zalmon onye Ahoa, Maharai onye Netofa;

29Hileb nwa Beana onye Netofa, Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin;

30Benaia onye Piraton, Hidai nke miri-iyi Gaash;

31Abi-albon onye Araba, Azmavet onye Bahurim;

32Eliahba onye Shaalabin, nke umu Jashen, Jonatan;

33Shama onye-Hararait, Ahiam nwa Shara onye-Ararait;

34Elifelet nwa Ahasbai, nwa onye Meakat, Eliam nwa Ahitofel onye Gailo;

35Hezro onye Kamel, Paarai onye Arab;

36Igal nwa Netan nke Zoba, Bani onye Gad;

37Zelek onye Amon, Naharai onye Beirot, onye nēbu ihe-agha Joab nwa Zeruaia;

38Ira onye Jeta, Gareb onye Jeta;

39Uraia onye Het: ha nile di orú ndikom na iri na asa.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help