JENESIS 45 - Bible Lgbo

1Ma Josef apughi ijisi onwe-ya ike n'iru ndi nile guzoworo onwe-ha n'akuku ya; o we kpọ òkù, si, Me ka madu ọ bula si n'ebe m'nọ pua. Ọ dighi kwa onye ọ bula guzoro n'ebe ọ nọ, mb͕e Josef mere ka umu-nne-ya mara ya.

2Ọ we welie olu-ya n'ikwa-ákwá: ndi Ijipt we nu, ulo Fero nukwara.

3Josef we si umu-nne-ya, Mu onwem bu Josef; nnam, ọ nọ ndu ub͕u a? Ma umu-nne-ya apughi iza ya; n'ihi na ha mara jijiji n'iru ya.

4Josef we si umu-nne-ya, Biko, biakutenum nso. Ha we bia nso. Ọ si, Mu onwem bu Josef nwa-nne-unu, onye unu rere je n'Ijipt.

5Ma ub͕u a ya ewutala unu, ya abu-kwa-la ihe iwe iwe di ọku n'anya-unu, na unu rerem bia n'ebe a: n'ihi na ọ bu idebe ndu ka Chineke zìrim ga n'iru unu.

6N'ihi na arọ abua ndia ka oké unwu a di n'etiti ala: arọ ise fọdu-kwa-ra nke ilu-ọlu-ubi na owuwe-ihe-ubi nāgaghi-adi.

7Chineke we zìem ga n'iru unu idoro unu n'uwa ndi fọduru, na idebere unu ndu ka unu buru oké ndi b͕apuru ab͕apu.

8Ub͕a a kwa, Ọ bughi unu onwe-unu ziterem n'ebe a, kama Chineke: O we mem ka m'ghọrọ Fero nna, na onye-nwe ulo-ya nile, na onye nāchi ala Ijipt nile.

9Menu ngwa, rigokuru nnam, si ya, Otú a ka nwa-gi Josef siri, Chineke, emewom ka m'ghọ onye-nwe Ijipt nile: ridakutem, atula ujọ:

10i gēbi n'ala Goshen, nọkwam nso, gi onwe-gi, na umu-gi, na umu umu-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi, na ndi nile i nwere:

11m'gāzù kwa gi n'ebe ahu; n'ihi na arọ ise nke oké unwu fọduru; ka ewe ghara inapu gi ihe nile, gi onwe-gi, na ulo-gi, na ndi nile i nwere.

12Ma, le, anya-unu na anya nwa-nnem, bú Benjamin, nāhu na ọ bu ọnum nāgwa unu okwu.

13Unu gēgosi kwa nnam nsọpurum nile n'Ijipt, na ihe nile nke unu huworo; unu gēme kwa ngwa me ka nnam ridata n'ebe a.

14Ọ we dakwasi Benjamin, bú nwa-nne-ya, n'olu, kwa ákwá; Benjamin kwa-kwa-ra ákwá n'olu-ya.

15Ọ we sutu umu-nne-ya nile ọnu, kwakwasi ha ákwá: emesia umu-nne-ya kpayere ya uka.

16Ewe nu ùdé-ya n'ulo Fero, si, Umu-nne Josef abiawo: ọ di nma n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya.

17Fero we si Josef, Si umu-nne-gi, Menu nka; bonu anumanu-unu ibu, la, ba n'ala Kenean;

18chiri-kwa-nu nna-unu na ulo-unu, biakutem: ka m'nye kwa unu ezi ihe nke ala Ijipt, unu gēri kwa urù ala nka.

19Ma gi onwe-gi ka enyeworo iwu, menu nka; sinu n'ala Ijipt chiri ub͕ọ-ala n'ihi umu-ntakiri-unu, na n'ihi nwunye nile unu, kuru-kwa-nu nna-unu, bia.

20Anya-unu adi-kwa-la n'ihe-unu; n'ihi na ezi ihe nke ala Ijipt nile, ọ bu unu nwe ya.

21Umu Israel we me otú a: Josef we nye ha ub͕ọ-ala n'okwu-ọnu Fero, o nye kwa ha ihe ha gēri n'uzọ.

22Ha nile n'otù ka o nyere uwe-nb͕okwasi nb͕anwe; ma o nyere Benjamin ọgu nkpuru-ego ọla-ọcha iri na ọgu ise na uwe-nb͕okwasi nb͕anwe ise.

23O ziga-kwa-ra nna-ya otú a; inyinya-ibu iri nēbu ufọdu n'ezi ihe nke Ijipt, na nne-inyinya-ibu iri nēbu ọka na achicha na nri nna-ya gēri n'uzọ.

24Ọ we zilaga umu-nne-ya, ha la: ọ si ha, Unu esela okwu n'uzọ.

25Ha si n'Ijipt rigo, ba n'ala Kenean, biakute Jekob nna-ha.

26Ha gosi ya, si, Josef nọ ndu ub͕u a, ha gosi kwa ya na ọ bu ya nāchi ala Ijipt nile. Obi-ya we b͕afue, n'ihi na ọ kweghi ha.

27Ha we gwa ya okwu Josef nile nke ọ gwara ha: mb͕e ọ huru ub͕ọ-ala nile nke Josef ziri ibute ya, mọ nke Jekob, bú nna-ha, we di ndu:

28Israel we si, O zuwo; Josef, bú nwam, nọ ndu ub͕u a: ka m'je, hu ya anya tutu mu anwua.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help