ỌLU NDI-OZI 12 - Bible Lgbo

1Ma dika n'oge ahu Herod, bú eze, tukwasiri aka-ya n'aru madu ufọdu nime nzukọ Kraist ime ha ihe ọjọọ.

2O we were mma-agha b͕ue Jemes nwa-nne Jọn.

3Ma mb͕e ọ huru na ọ di ndi-Ju utọ, o we jidekwasi Pita. Ubọchi ahu bu ubọchi achicha ekoghi-eko.

4Mb͕e o jidesiri ya, ọ tubà ya n'ulo-nkpọrọ, we rara ya nye n'aka ndi-agha iri na isi iche ya anọ anọ; nēzube ikuputa ya nye ndi-Ju mb͕e ememe ngabiga gasiri.

5Ya mere edebere Pita n'ulo-nkpọrọ: ma nzukọ Kraist nēkpegidesi ekpere ike nye Chineke n'ihi ya.

6Ma mb͕e Herod gaje ikuputa ya, n'otù abali ahu Pita nāraru ura n'etiti ndi-agha abua, eji nkpọrọ abua ke ya ab͕u: ndi-nche ndi nọ n'iru ọnu-uzọ nēchebe ulo-nkpọrọ.

7Ma le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi guzoro ya nso, ìhè nwu-kwa-ra n'ime-ulo nke ulo-nkpọrọ: o we tie Pita aka n'akuku, kpote ya, si, Bilie ọsọsọ. Nkpọrọ-ya abua we dapu n'aka-ya abua.

8Mọ-ozi ahu we si ya, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, yiri kwa akpukpọ-ukwu sandal gi. O we me otú ahu. Ọ we si ya, B͕okwasi uwe uku gi n'aru-gi, sọkwam.

9O we pua, so ya; ma ọ mataghi na ọ bu ezie, bú ihe emere site n'aka mọ-ozi, kama ọ nēchè na ọ nāhu ọhù.

10Ma mb͕e ha gasiri ndi-nche mbu na ndi-nche nke-abua, ha biaruru ọnu-uzọ-ama ígwè ahu nke esi abà nime obodo; nke meghere onwe-ya nye ha: ha we pua, gabiga n'otù uzọ ntà; ngwa ngwa mọ-ozi ahu we pua n'ebe ọ nọ.

11Mb͕e Pita mara onwe-ya, ọ si, Ub͕u a ka m'matara n'ezie, na Onye-nwe-ayi ziputara mọ-ozi-Ya, weputam n'aka Herod, ya na ile-anya nile nke ndi-Ju.

12Mb͕e ọ ghọtasiri ihe ahu, ọ bia rue ulo Meri nne Jọn onye akpọ-kwa-ra Mark; ebe ọtutu madu zukọrọri nēkpe kwa ekpere.

13Ma mb͕e ọ kuru aka n'ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, otù nwa-ab͕ọghọ, aha-ya bu Roda, biara iṅa nti.

14Ma mb͕e ọ matara olu Pita, o megheghi ọnu-uzọ-ama n'ihi ọṅù, ma ọ b͕abàra nime ulo, kọrọ ha na Pita guzoro n'iru ọnu-uzọ-ama.

15Ma ha siri ya, Anya adighi gi nma. Ma o nēkwusi ike na ọ bu otú a. Ha we si, Ọ bu mọ-ozi-ya.

16Ma Pita nākugide aka n'ọnu-uzọ: mb͕e ha meghesiri, ha hu ya, ibobo we nwua ha n'aru.

17Ma mb͕e o kpukpusiri ha aka ikpuchi ọnu-ha, ọ kọrọ ha otú Onye-nwe-ayi duputara ya-ri n'ulo-nkpọrọ. Ọ si, Kọrọ Jemes na umu-nna-ayi ihe ndia. O we pua, ga ebe di iche.

18Ma mb͕e chi bọrọ, ọ bughi nkpasu ntà putara n'etiti ndi-agha, ihe mere Pita.

19Mb͕e Herod chọsiri ya, ma ọ chọtaghi ya, ọ kpe ndi-nche-ya ikpé, nye iwu ka ewe dupu ha ib͕u ha. O we si na Judia ridata na Sisaria, we nọgide n'ebe ahu.

20Ma Herod nēbu agha nke-uku megide Taia na Saidon n'obi-ya: ha we were otù obi biakute ya; mb͕e ha mesiri Blastọs eyì-ha, nke bu onye nēle ime-ulo-ndina nke eze anya, ha we riọ ka udo di n'etiti ha, n'ihi na esi n'ala nke eze ahu azù ala-ha.

21N'ubọchi akara àkà Herod we yikwasi uwe nke eze, nọkwasi n'oche-ikpé, gwa ha okwu.

22Ọra madu we tie nkpu, si, Ọ bu olu chi, ọ bughi kwa olu nke madu.

23Ngwa ngwa mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we tie ya ihe, n'ihi na ọ nyeghi Chineke otuto ahu: ikpuru we tab͕ue ya, o we kubìe ume.

24Ma okwu Chineke nāga n'iru, nāba kwa uba.

25Banabas na Sọl we si na Jerusalem laghachi, mb͕e ha jezuru ozi-ha, nēkuru Jọn nke akpọ-kwa-ra Mark ya na ha yikọ je.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help