ABÙ ỌMA 65 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma. Abù Devid.

1Gi ka otuto nēdere du, Chineke, nime Zaion:

Ọ bu kwa Gi ka anākwughachi nkwa ekwere.

2Gi Onye nānu ekpere,

Gi ka anu-aru nile, bú madu, gābiakute.

3Okwu nile nke ajọ omume nile dikaririm ike:

Njehie nile ayi, Gi onwe-gi gēkpuchi ha.

4Ihe nāgara ya nke-ọma, bú onye I nārọputa,

Onye I nēme kwa ka ọ biarue nso,

Ka o we biri n'ogige-Gi nile:

Ka afọ ju ayi n'ezi ihe nke ulo-Gi,

Bú ebe nsọ nke ulo uku Gi.

5Ihe di egwu ka I nēji za ayi n'ezi omume,

Chineke nke nzọputa-ayi;

Gi Onye bu ihe-ntukwasi-obi nke nsọtu nile nke uwa,

Na nke oké osimiri, bú ebe di iche iche di anya:

6Onye nēji ike-Ya me ka ugwu nile guzosie ike;

Ebe ewerewo idi-ike ke Ya n'úkwù:

7Onye nēme ka nkpọtu oké osimiri dajua, bú nkpọtu nmali-miri-ha,

Ya na ùzù nke mba nile.

8Ndi bi na nsọtu nile nke uwa we nātu egwu ihe-iriba-ama nile gi:

I nēme ka ọpupu nile nke ututu na anyasi tie nkpu ọǹù.

9I letawo ala, we me ka o juputa n'ihe,

I nēme ka ọ nwe àkù ri nne;

Miri-iyi Chineke juputara na miri

I nēdozi ọka-ha, mb͕e I si otú a dozie ala onwe-ya.

10I nēdè ọ̀b͕à-ala-ubi-ya miri:

I nēme ka ebe elu ya nile di lari:

I nēji oké miri-ozuzo b͕aze ya;

I nāgọzi ihe-opupú-ya.

11I kpubewo arọ nke ezi ihe-Gi okpu-eze;

Uzọ-Gi nile nātasasi kwa abuba.

12Ha nātasa n'ebe-ita-nri niile nke ọzara:

Anēji kwa otite-egwú-ọṅù ke ugwu ntà nile n'úkwù.

13Ewerewo igwè ewu na aturu yikwasi ebe-ita-nri nile dika uwe;

Anēwere ọka kpuchie ndagwurugwu nile;

Ha nēti nkpu ọǹù, e, ha nābù abù.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help