ABÙ ỌMA 112 - Bible Lgbo

1Tonu Ja.

Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke nātu egwu Jehova.

Nke ihe nile O nyere n'iwu nātọ utọ nke-uku.

2Ndi-dike ka nkpuru-ya gābu n'uwa:

Agāgọzi ọb͕ọ ndi ziri ezi.

3Ihe di iche iche di oké ọnu-ahia na àkù di n'ulo-ya:

Ezi omume-ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

4Ihè awaliwo n'ọchichiri nye ndi ziri ezi:

Ọ bu onye-amara, na onye nwere obi-ebere, na onye ezi omume.

5Ọ diri nwoke ahu nma, bú onye nēme-ebere, nēbinye kwa madu ihe;

Ọ gākwagide okwu-ya nile n'ikpé.

6N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewezuga ya n'onọdu-ya:

Ihe-ncheta ebighi-ebi ka onye ezi omume gābu.

7Ọ gaghi-esite n'ihe ọjọ anuworo tu egwu:

Edoziwo obi-ya, ebe ọ nātukwasi Jehova obi.

8Ihe anākwagide ka obi-ya bu, ọ gaghi-atu egwu,

Rue mb͕e ọ gēlekwasi ndi nākpab͕u ya anya.

9Ọ ghasawo àkù-ya, o nyewo ndi-ob͕eye ihe;

Ezi omume-ya nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi:

Agēwere nsọpuru me ka mpi-ya di elu.

10Onye nēmebi iwu gāhu ya, ewe kpasue ya iwe;

Ọ gāta ikekere-ezé, b͕aze kwa:

Ọchichọ ndi nēmebi iwu nāchọsi ike gāla n'iyì.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help