ABÙ ỌMA 146 - Bible Lgbo

1Tonu Ja.

Nkpuru-obim, to Jehova.

2M'gēto Jehova n'ogologo ndum nile:

M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu.

3Unu atukwasila obi n'aru ndi amara aha-ha,

Ma-ọbu n'aru nwa nke madu, onye ọ nādighi nzọputa o nwere.

4Mọ-ya nāpu apu, o we laghachi n'ala o si puta;

N'ubọchi ahu èchìchè-ya nile alawo n'iyì.

5Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ahu bu nke Chineke nke Jekob bu Onye nēyere ya aka,

Nke olile-anya-ya dikwasi Jehova, bú Chineke-ya:

6Onye meworo elu-igwe na uwa,

Na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha;

Onye nēdebe ezi-okwu rue mb͕e ebighi-ebi:

7Onye nēmere ndi anēmeb͕u ihe O kpere n'ikpe;

Onye nēnye ndi agu nāgu nri:

Jehova nātọpu ndi-nkpọrọ;

8Jehova nēmeghe anya ndi-ìsì;

Jehova nēkuli ndi nēruda n'ala;

Jehova n'ahu ndi ezi omume n'anya;

9Jehova nēdebe ndi ala ọzọ;

Nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru ka Ọ nēme ka ha guzo ọtọ;

Ma uzọ ndi nēmebi iwu ka Ọ nēme ka ọ b͕agọ ab͕agọ.

10Jehova gābu eze rue mb͕e ebighi-ebi,

Chineke-gi, Zaion, gābu eze rue ọb͕ọ nile.

Tonu Ja.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help