I. IHE EMERE 25 - Bible Lgbo

1Devid na ndi-isi usu-ndi-agha we kewaputara òfùfè ufọdu nime umu Esaf, na nke Himan, na nke Jedutun, ndi nēwere ubọ-akwara, na une, na ájà, bu amuma: ọnu-ọgugu-ha, bú ndikom nēje ozi dika òfùfè-ha si di, we di:

2nke umu ndikom Esaf; Zakua, na Josef, na Netanaia, na Asharela, bú umu Esaf; ha nọ n'aka Esaf, onye nēbu amuma n'aka eze.

3Nke Jedutun: umu-ndikom Jedutun; Gedalaia, na Zeri, na Jeshaia, na Hashabaia, na Matitaia, isi; ha nọ n'aka nna-ha, bú Jedutun, onye nēwere ubọ-akwara bu amuma bayere ikele na ito Jehova.

4Nke Himan: umu-ndikom Himan; Bukia, na Matanaia, na Uziel, na Shebuel, na Jerimot, na Hananaia, na Hanani, na Eliata, na Gidalti, na Romamti-eza, na Joshbekasha, na Maloti, na Hotia, na Mahaziot:

5ndia nile bu umu-ndikom Himan, bú onye-ọhu-uzọ eze n'okwu Chineke, iweli mpi elu. Chineke we nye Himan umu-ndikom iri na anọ na umu-ndinyom atọ.

6Ndia nile nọ n'aka nna-ha n'ibù abù n'ulo Jehova, chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, iji fè òfùfè nke ulo Chineke; ha nọ n'aka eze, bú Esaf, na Jedutun, na Himan.

7Ọnu-ọgugu-ha, tiyere umu-nne-ha, ndi ezíworo abù anābùku Jehova, bú ndi nile nwere nghọta, di ọgu iri-na-anọ na asatọ.

8Ha we fe nzà bayere ihe-ndebe-ha, ha nile n'otù aka ahu, ma onye ntà ma onye uku, onye nwere nghọta tiyere onye anēzí ihe.

9Ife-nzà mbu nke putara Esaf mara Josef: nke-abua mara Gedalia; ya onwe-ya na umu-nne-ya na umu-ya ndikom di iri na abua:

10nke-atọ mara Zakua, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

11nke anọ mara Izri, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

12nke-ise mara Netanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

13nke-isi mara Bukia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

14nke-asa mara Jesharela, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

15nke-asatọ mara Jeshaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

16nke-iteghete mara Matanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

17nke-iri mara Shimai, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

18nke-iri-na-otù mara Azarel, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

19nke-iri-na-abua mara Hashabaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

20n'ife-nzà nke-iri-na-atọ ọ mara Shubael, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

21nime nke-iri-na-anọ ọ mara Matitaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

22nime nke-iri-na-ise ọ mara Jeremot, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

23nime nke-iri-na-isi ọ mara Hananaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

24nime nke-iri-na-asa ọ mara Joshbekasha, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

25nime nke-iri-na-asatọ ọ mara Hanani, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

26nime nke-iri-na-iteghete ọ mara Maloti, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri-na-abua:

27nime nke-orú ọ mara Eliata, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

28nime nke-orú-na-otù ọ mara Hotia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

29nime nke-orú-na-abua ọ mara Gidalti, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

30nime nke-orú-na-atọ ọ mara Mahaziot, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

31nime nke-orú-na-anọ ọ mara Romamti-eza, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help