I. IHE EMERE 24 - Bible Lgbo

1Ekè-kwa-ra umu Eron òkè nile ha. Umu-ndikom Eron; Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.

2Nedab na Abaihu we nwua n'iru nna-ha, ha enweghi kwa umu-ndikom: Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà.

3Devid we kè ha, ya na Zedok, onye sitere n'umu Eleeza, na Ahimelek, sitere n'umu Itama, dika ihe-nlekọta-ha si di n'òfùfè-ha.

4Ewe chọta ọtutu umu Eleeza ibu ndi-isi nke ndikom di ike kari umu Itama; ewe kè ha otú a: umu Eleeza nwere ndi-isi ulo nke ndi bu nna iri na isi; umu Itama nwe-kwa-ra asatọ, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.

5Ewe kè ha n'ife-nzà, ndi Eleeza na ndi Itama n'otù; n'ihi na ndi-isi ebe nsọ di, na ndi-isi nke Chineke, ndi sitere n'umu Eleeza na n'etiti umu Itama.

6Shemaia nwa Netanel, bú ode-akwukwọ, onye sitere na ndi Livai, we de ha n'akwukwọ n'iru eze, na ndi-isi, na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Ahimelek nwa Abaiata, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai: otù ulo nna nke Eleeza ka ejidere, ejide-kwa-ra otù nke Itama.

7Ife-nzà mbu we putara Jehoiarib, nke-abua putara Jedaia;

8nke-atọ putara Harim, nke-anọ putara Seorim;

9nke-ise putara Malkija, nke-isi putara Mijamin;

10nke-asa putara Hakoz, nke-asatọ putara Abaija;

11nke-iteghete putara Jeshua, nke-iri putara Shekania;

12nke-iri-na-otù putara Elaiashib, nke-iri-na-abua putara Jakim;

13nke-iri-na-atọ putara Hupa, nke-iri-na-anọ putara Jeshebeab;

14nke iri-na-ise putara Bilga, nke-iri-na-isi putara Imea;

15nke-iri-na-asa putara Hezia, nke-iri-na-asatọ putara Hapizez;

16nke-iri-na-iteghete putara Petahia, nke-orú putara Jehezkel;

17nke-orú-na-otù putara Jakin, nke-orú-na-abua putara Gamul;

18nke-orú-na-atọ putara Delaia, nke-orú-na-anọ putara Maazia.

19Ndia bu ihe-nlekọta-ha ifè òfùfè-ha, ibà n'ulo Jehova, dika ikpé-ha si di site n'aka Eron nna-ha, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere ya iwu.

20Ma nke umu Livai ndi fọduru: nke umu Amram, Shubael; nke umu Shubael, Jehdeia.

21Nke Rehabia: nke umu Rehabia, onye-isi bu Ishia.

22Nke ndi Izha, Shelomot; nke umu Shelomot, Jahat.

23Umu-ndikom Hebron kwa; Jeria, bú onye-isi, na Amaraia, bú nke-abua, na Jehaziel, bú nke-atọ, na Jekameam, bú nke-anọ.

24Umu-ndikom Uziel, Maika; nke umu-ndikom Maika, Shamia.

25Nwa-nne Maika, Ishia: nke umu-ndikom Ishia, Zekaraia.

26Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi: umu-ndikom Jaazia; Beno.

27Umu-ndikom Merari; nke Jaazia, Beno, na Shoham, na Zakua, na Ibri.

28Nke Mahli; Eleeza, onye nēnweghi umu-ndikom.

29Nke Kish; umu-ndikom Kish, Jerahmeel.

30Umu-ndikom Mushi kwa; Mahli, na Ida, na Jerimot. Ndia bu umu ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.

31Ndia fe-kwa-ra nzà, ọbuná dika umu-nne-ha, bú umu Eron, fere, n'iru Devid, bú eze, na Zedok, na Ahimelek, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai; ulo nke ndi bu nna nke onye-isi ọbuná dika nke nwa-nne-ya nke-ntà.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help