MAIKA 4 - Bible Lgbo

1Ọ gēru kwa, n'ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n'elu ugwu nile, agēbuli kwa ugwu ahu elu kari ugwu ntà nile; ndi di iche iche gērùbà nime ya dika osimiri.

2Ọtutu mba gēje kwa, si, Bianu, ka ayi rigorue ugwu Jehova, ru kwa ulo Chineke nke Jekob; Ọ gēzí kwa ayi uzọ-Ya ufọdu, ayi gēje kwa ije n'okporo-uzọ-Ya nile: n'ihi na Zaion ka iwu gēsi puta, okwu Jehova gēsi kwa na Jerusalem puta.

3Ọ gēkpe kwa ikpe n'etiti ọtutu ndi di iche iche, dozi-kwa-ra mba di iche iche nwere ume okwu-ha rue ebe di anya; ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ọgè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agaghi-ebuli mma-agha megide mba, ha agaghi-amuta kwa agha ọzọ.

4Ma ha gēbi, onye ọ bula n'okpuru osisi vine ya na n'okpuru osisi fig ya; ọ dighi kwa onye gēme ka ha ma jijiji: n'ihi na ọnu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ekwuwo okwu.

5N'ihi na ndi nile di iche iche nējeghari, onye ọ bula n'aha nke chi-ya; ayi onwe-ayi ganējeghari kwa n'aha Jehova, bú Chineke-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi.

6N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ka M'gēme ka nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi zukọta, ọ bu kwa nwanyi ahu nke achupuru achupu ka M'gāchikọta, ya na nwanyi nke M'meworo ihe ọjọ;

7M'gēme kwa ka nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi ghọ ndi fọduru afọdu, M'gēme kwa ka nwanyi ahu nke emere ka ọ nọ n'ebe di anya ghọ mba nwere ume: Jehova gābu kwa eze-ha n'ugwu Zaion site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

8Ma gi onwe-gi, ulo-elu nke ìgwè aturu, Ofel nke ada Zaion, gi ka ọ gābiakute; e, ọchichi anāchi mbu gābia, bú ala-eze nke diri ada Jerusalem.

9Ub͕u a n'ihi gini ka i nētisi nkpu ike? Ọ̀ bu na eze adighi na gi? onye-ndum-ọdu-gi, ọ lawo n'iyì, na ihe-nb͕ali ejidewo gi dika nke nwanyi ime nēme?

10Nāb͕ali, Jisie ike imuputa nwa, gi ada Zaion, dika nwanyi ime nēme: n'ihi na ub͕u a ka i gāpu n'obodo, biri n'ọhia, biarue Babilon; n'ebe ahu ka agānaputa gi; n'ebe ahu ka Jehova gāb͕aputa gi n'aka ndi-iro-gi.

11Ma ub͕u a ọtutu mba achikọtawo onwe-ha imegide gi, ndi nāsi, Ka emerua ya, ka anya-ayi lekwasi kwa Zaion.

12Ma ndi ahu amaghi èchìchè nile nke Jehova, ha aghọtaghi kwa ndum-ọdu-Ya: n'ihi na Ọ chikọtawo ha dika ùkwù-ọka n'ebe-nzọcha-ọka.

13Bilie, zọcha, gi ada Zaion: n'ihi na mpi-gi ka M'gēme ka ọ ghọ ígwè, ọ bu kwa ukwu-gi ka M'gēme ka ha ghọ ọla: i gāzọpia kwa ọtutu ndi di iche iche: M'gēwezuga kwa urù-ha nye Jehova, wezuga kwa àkù-ha nye Onye-nwe uwa nka nile.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help