NDI KỌLỌSI 4 - Bible Lgbo

1Ndi-nwe madu, nēnye-kwa-nu ndi-orù-unu ihe ziri ezi na nke ra nrata; ebe unu matara na unu onwe-unu nwe-kwa-ra otù Onye Nke bu Onye-nwe-unu n'elu-igwe.

2Nānọgidesinu ike n'ekpere-unu, nāmu-kwa-nu anya nime ya n'ikele-ekele;

3nēkpe-kwa-nu ekpere n'ihi ayi n'otù oge ahu, ka Chineke we meghere ayi ọnu-uzọ ikwusa okwu-Ya, ka ayi kwue ihe-omimi nke Kraist, nke m'nọ kwa n'ab͕u n'ihi ya;

4ka m'we me ka ọ puta ìhè, dika m'nāghaghi ikwu ya.

5Nējegharinu n'amam-ihe n'ebe ndi nọ n'èzí nọ, nāzuchapuru onwe-unu oge a nile.

6Ka okwu-unu di n'amara mb͕e nile, ihe eji nnú me ka ọ di utọ, ka unu we mata otú unu nāghaghi iza madu nile ọ bula.

7Madu nke gēme ka unu mara ihe nile bayere mu onwem bu Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n'anya, buru kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n'ije-ozi, buru kwa orù-ibem nime Onye-nwe-ayi:

8onye m'nēzitere unu ime ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu.

9Anamezite kwa Ọnisimọs, bú nwa-nna-ayi ahu kwesiri ntukwasi-obi, onye ahu-kwa-ra n'anya, onye bu otù onye n'etiti unu. Ha gēme ka unu mara ihe nile nke anēme n'ebe a.

10Aristakọs onye adọkọrọ mu na ya n'agha nēkele unu, ya na Mak nwa-nne Banabas (onye unu natara ihe ufọdu enyere n'iwu bayere ya; asi na ọ biakute unu, naranu ya nke-ọma),

11Jisus kwa, onye anākpọ Justọs, madu atọ ndia sitere n'obibì-úgwù: nání ndia bu ndi sorom nālukọ ọlu n'ikwusa ala-eze Chineke, madu ndi emere ka ha burum ndi-ngugù-obi.

12Epafras, onye bu otù onye n'etiti unu, orù nke Kraist Jisus, nēkele unu, nāb͕asi nb͕a ike n'ihi unu n'ekpere-ya nile mb͕e nile, ka unu we guzo dika ndi zuru okè ndi kwezuwo-kwa-ra ihe nile Chineke nāchọ.

13N'ihi na anamab͕ara ya àmà, na ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nke-uku nye unu na ndi nọ na Leọdisia na ndi nọ na Hierapọlis.

14Luk, bú dibia nke ahuru n'anya, nēkele unu, ya na Dimas.

15Kelenu umu-nna-ayi ndi nọ na Leọdisia, na Nimfas, na nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha.

16Ma mb͕e ọ bula agāgusi akwukwọ-ozi a n'etiti unu, menu ka agu kwa ya na nzukọ Kraist nke ndi Leọdisia; lezi-kwa-nu anya ka unu onwe-unu gu kwa akwukwọ ozi ahu si na Leọdisia bia.

17Ọzọ, sinu Akipọs, Lezie ije-ozi nke i natara nime Onye-nwe-ayi anya, ka i jezu ya.

18Ekele nke mu Pọl, nke m'ji aka nkem de. Chetanu ab͕um. Ka amara diyere unu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help